Jeremaya 21:9 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a9 Onye ọbụla nʼime unu nọgidere nʼobodo a ka mma agha, maọbụ ụnwụ, maọbụ ihe otiti ga-egbu. Ma onye ọbụla nʼime unu pụkwuru ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu, were onwe ya nyefee ha nʼaka, ga-adị ndụ; ọ ga-echebekwa ndụ ya. Faic an caibideilBible Nso9 Onye nānọgide n'obodo a gānwu site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe: ma onye nāpu apu, nke nādakuru ndi Kaldea ndi nānọchigide unu n'agha, ọ gādi ndu, ndu-ya ewe ghọrọ ya ihe-nkwata. Faic an caibideil |
Mgbe nke a mesịrị, Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, aga m ewere Zedekaya eze Juda, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị niile bi nʼobodo a, ndị mma agha na ụnwụ na ihe otiti ndị a na-egbughị, nyefee ha nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, na nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọsi ndụ ha ike. Ọ ga-eji mma agha gbuo ha. Ọ gaghị emere ha ebere, ọ gaghị egosikwa ha ọmịiko.’