Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 21:4 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru: Lee ejikerela m ugbu a ichigharị ihe agha niile dị unu nʼaka, nke unu ji na-ebuso eze Babilọn na ndị Kaldịa gbara obodo unu gburugburu agha, e, ejikerela m ichigharị ha megide unu. Aga m akpọbata ha nʼime obodo a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

4 Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'ganēchighari ihe agha nile nke di n'aka-unu, nke unu onwe-unu ji ebuso eze Babilon na ndi Kaldea agha, bú ndi nānọchigide unu n'agha n'azu mb͕idi obodo, M'gāchikọta kwa ha n'etiti obodo a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 21:4
23 Iomraidhean Croise  

Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ, maọbụ dọkpụrụ unu dịka ndị mkpọrọ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.


Gee ntị nụrụ ụzụ na-ada nʼugwu niile; gee ntị nụrụ ụzụ yiri ụzụ nke igwe mmadụ na-eme. Gee ntị nụrụ mkpọtụ na-ada nʼetiti alaeze dị iche iche. Dịka mkpọtụ na-eme mgbe ọtụtụ mba na-ezukọta nʼotu ebe. Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-achịkọta ndị agha ya nʼihi ibu agha.


Ugbu a, lee, ihe m na-aga ime ubi vaịnị m a. Aga m ewepụ ihe mgbochi a gbara ya, hapụ ya ka ọ ghọọ ebe anụ ụlọ na-ata nri. Aga m etida mgbidi ya hapụ ya ka ọ bụrụ ebe a na-azọtọ ụkwụ.


Nʼihi na nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Aga m eme ka ị ghọọrọ onwe gị, ghọọkwara ndị enyi gị niile ihe egwu. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ ha mgbe mma agha ndị iro ha ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-eburu ndị niile bi nʼime ya gaa Babilọn. Ọ ga-egbu ndị fọdụrụ.


Ma Jeremaya zara sị ha, “Gwanụ Zedekaya sị ya,


“Lee ka ndị iro si wuo ihe agha ha gburugburu mgbidi obodo a, ihe agha nke ha ga-eji lụta ya nʼagha. I werela obodo a nyefee ndị Babilọn na-ebuso ya agha nʼaka, nʼihi mma agha na ụnwụ, na oke ọrịa dị nʼime ya. Ihe i kwuru na ọ ga-eme emezuola, dịka i si ahụ ya ugbu a.


Zedekaya eze Juda tụrụ ya mkpọrọ nʼebe ahụ, sị ya, “Gịnị mere i ji na-ebu amụma dị otu a. Nʼihi na ị na-asị, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ejikerela m inyefe gị na obodo a nʼaka eze Babilọn. Ọ ga-alụtakwa ya nʼagha.


onye ga-eduru ya, bụ Zedekaya, gaa Babilọn, ebe ọ ga-anọ tutu ruo mgbe mụ, bụ Onyenwe anyị, mesiri ya ike. Ọ bụrụ na ibuso ndị Babilọn agha, ị gaghị emeri.’ ”


nʼagha a na-alụso ndị Babilọn. ‘Aga eji ozu ndị mmadụ ahụ niile m ga-etigbu site nʼiwe m na nʼọnụma m kpojuo ha. Aga m ezo ihu m site nʼebe obodo a nọ, nʼihi ajọ omume ya niile.


“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel kwuru: ‘Geenụ ntị! Lee, ana m aga ime ka ihe ọjọọ bịakwasị Juda na ndị niile bi na Jerusalem, dịka m kwuru na ọ ga-adị. Nʼihi na agwala m ha okwu, ma ha jụrụ ige m ntị. Akpọrọ m ha oku, ma ha jụrụ ịza.’ ”


Mgbe ahụ, ndịisi niile nke eze Babilọn batara were ọnọdụ ha nʼọnụ ụzọ ama nke Etiti. Ndị a bụ ndị batara: Negal-Shareza onye Samga, na Nebo-Sasekim, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza onyeisi nke ọkwa ya dị elu, na ndịisi niile ọzọ nke eze Babilọn ndị fọdụrụ.


Ha chịkọọrọ ite niile, na shọvel niile na ihe ịkpakepụ ọkụ niile, na efere ịkwọsa mmiri niile, na ngaji ukwu niile, na ihe bronz niile, bụ nke e ji eje ozi nʼime ụlọnsọ ahụ.


O sitela nʼoke iwe ya bipụ ike niile Izrel nwere. O seghachiri aka nri ya, mgbe ndị iro ha na-abịa nso. O nwukwara dịka ọkụ na-enwusi ike nʼetiti Jekọb; si otu a rechapụ ihe niile dị gburugburu ya.


Onyenwe anyị dị ka onye iro, o lomichaala Izrel. O lomichaala ụlọeze ya niile, bibiekwa ebe ya niile e wusiri ike. O meela ka iru ụjụ na ịkwa akwa mụbaara ada Juda.


Onyenwe anyị ajụla ebe ịchụ aja ya gbakụta ebe nsọ ya azụ. O werela mgbidi niile nke ụlọeze ya nyefee nʼaka onye iro; ha emeela ka olu ha daa ụda nʼime ụlọ Onyenwe anyị dịka nʼụbọchị mmemme a kara aka.


Mgbe ahụ, aga m etichapụ ụta dị gị nʼaka ekpe, meekwa ka àkụ niile nke dị nʼaka nri gị dachapụ.


A sịkwa na ha azụlite ụmụ ha, aghaghị m ime ka ha nwụọ. Ahụhụ ga-adịrị ha, mgbe m si nʼebe ha nọ wezuga onwe m.


Aga m achịkọta mba niile ka ha bịa Jerusalem ibuso ya agha. Ha ga-adọta obodo ahụ nʼagha, tụtụkọọ ihe dị nʼụlọ niile, dinaa ndị inyom nʼike. A ga-adọta ọkara ndị bi nʼobodo ahụ nʼagha, duru ha gaa mba ọzọ. Ma ọkara nke ọzọ ka ha ga-ahapụ.


Onye eze ahụ were iwe nke ukwuu, zipụ ndị agha ya ka ha gaa laa ndị ogbu mmadụ ahụ nʼiyi, rechapụkwa obodo ha nʼọkụ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan