Jeremaya 20:8 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a8 Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu. Aga m akpọ mkpu banyere ihe ike na ịla nʼiyi. Nʼihi na okwu Onyenwe anyị ewetarala m mkparị na ịkwa emo ụbọchị niile. Faic an caibideilBible Nso8 N'ihi na mb͕e ọ bula m'nēkwu, etim nkpu; Ihe-ike na Ipunara-madu-ihe, ka m'nākpọ nkpu: n'ihi na okwu Jehova ghọrọm ihe-ita-uta na ihe-ikwa-emò ogologo ubọchi nile. Faic an caibideil |
Ya mere, aga m eme ka ọdụm si nʼoke ọhịa bịa lụso ha ọgụ; nkịta ọhịa bi nʼọzara ga-ebibi ha. Otu a kwa, agụ ga-abịa makpuru nso nso obodo ha ịdọkasị onye ọbụla si nʼime obodo ahụ na-apụta. Ihe ndị a ga-emezu nʼihi na nnupu isi ha adịla ukwuu, na nʼihi na ndaghachi azụ ha site na iso ụzọ m adịla ukwuu.