Jeremaya 20:6 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a6 Ma gị onwe gị bụ Pashua, na ndị niile bi nʼụlọ gị, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa Babilọn. Nʼebe ahụ ka ị ga-anwụ. Ebe ahụ kwa ka a ga-eli gị, gị na ndị enyi gị ndị a niile ị na-eburu amụma ụgha.’ ” Faic an caibideilBible Nso6 Gi onwe-gi kwa, Pashua, na ndi nile bi n'ulo-gi gēje na ndọta-n'agha: ọ bu kwa Babilon ka i gābata, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka agēlì gi, gi onwe-gi, na ndi nile nāhu gi n'anya, ndi i buworo amuma ugha. Faic an caibideil |
Nʼihi na nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Aga m eme ka ị ghọọrọ onwe gị, ghọọkwara ndị enyi gị niile ihe egwu. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ ha mgbe mma agha ndị iro ha ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-eburu ndị niile bi nʼime ya gaa Babilọn. Ọ ga-egbu ndị fọdụrụ.
ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Mụ onwe m aghaghị ịta Shemaya onye Nehelam na mkpụrụ ya ahụhụ nʼihi mmehie ya. Ọ gaghị enwe nwoke ọbụla ga-afọdụ ndụ nʼetiti ndị ya niile. Ọ gaghị esokwa unu lekwasị anya nʼihe ọma ahụ niile m na-akwado imere ndị m, nʼihi na o kwusara nnupu isi megide Onyenwe anyị. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.’ ”