Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 20:3 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Nʼechi ya, mgbe Pashua tọpụrụ ya site nʼagbụ ahụ, Jeremaya sịrị ya, “Onyenwe anyị akpọghị gị Pashua, kama aha gị bụ Mago-Misabib, nke pụtara, Nwoke ihe egwu gbara gburugburu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

3 O rue n'echi-ya, na Pashua mere ka Jeremaia si n'ọtọsi ahu puta. Jeremaia we si ya, Ọ dughi Pashua ka Jehova kpọworo aha-gi, kama ọ bu Megoa-misabibi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 20:3
18 Iomraidhean Croise  

Chineke gwakwara Ebraham sị, “Ma nʼebe Serai nwunye gị nọ, ị gaghị akpọkwa ya Serai ọzọ, kama aha ya ga-abụ Sera.


Aha gị agaghị abụkwa Ebram, kama ọ ga-abụ Ebraham, nʼihi na emeela m gị nna nke ọtụtụ mba.


Nwoke ahụ zara sị ya, “Aha gị agaghị abụkwa Jekọb, kama ọ ga-abụ Izrel, nʼihi na gị na Chineke na ndị mmadụ gbara mgba, ị mmeri.”


Anụla m nkwulu ha megide m; oke egwu dị nʼakụkụ niile; ha na-agba izu megide m, na-agba izu nzuzo iji napụ m ndụ m.


Emesịa, mụ na nwunye m, bụ onye amụma dinakọrọ, ọ tụụrụ ime, mụọrọ m nwa nwoke. Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Gụọ ya Maha-shalal-Hash-Baz.


jee na Ndagwurugwu nke Ben Hinom, nke dị nso nʼọnụ ụzọ ama Ejuju dị nʼọwụwa anyanwụ. Nọdụ nʼebe ahụ kwupụtara ha okwu ndị m gwara gị.


Ya mere, kpacharanụ anya, nʼihi na ụbọchị ahụ na-abịa, ka Onyenwe anyị kwubiri, mgbe ndị mmadụ agaghị akpọkwa ebe a Tofet ma ọ bụkwanụ Ndagwurugwu nke Ben Hinom, kama a ga-akpọ ya Ndagwurugwu Ogbugbu.


Ana m anụ ọtụtụ akụkọ nzuzo, “Oke egwu nʼakụkụ niile! Jụụnụ ya! Ka anyị jụụnụ ya!” Ndị enyi m niile nọ na-eche mgbe m ga-azọhie ụkwụ daa, na-asị, “Ma eleghị anya ọ ga-abụ onye eduhiere, mgbe ahụ, anyị ga-emegide ya, bọọrọ onwe anyị ọbọ nʼahụ ya.”


Zefanaya bụ onye nchụaja, gụrụ akwụkwọ ozi ahụ nʼihu Jeremaya, bụ onye amụma.


Gịnị ka anya m abụọ hụrụ? Ụjọ na-atụ ha, ha na-agbaghachikwa azụ; lee, a na-etipịa ndị ha bụ dike nʼagha. Ha na-agbasi ọsọ ike, na-eleghị anya nʼazụ. Egwu dịkwa nʼakụkụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.


Ka onye ọbụla gharakwa ịga nʼubi, maọbụ ijegharị nʼokporoụzọ, nʼihi na ndị iro ji mma agha na-agagharị, egwu dịkwa nʼebe niile.


Ya mere, kpacharanụ anya, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe ndị mmadụ na-agaghị akpọkwa ebe ahụ Tofet maọbụ Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Kama ha ga-akpọ ya ndagwurugwu ogbugbu mmadụ, nʼihi na ha ga-eli ọtụtụ ndị ha na Tofet ruo mgbe ha na-agaghị ahụkwa ebe ha ga-eli ndị fọdụrụ.


“Dịka i si akpọ oku ka a bịa nʼụbọchị oriri, otu a ka i si kpọkọta ihe egwu niile ka ha bịakwasị m nʼakụkụ niile. Nʼụbọchị nke iwe Onyenwe anyị ọ dịghị onye gbapụrụ ọsọ, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ ndụ; ndị m lekọtara, zụlitekwa ka ndị iro m lara nʼiyi.”


Aka m ga-emegide ndị amụma niile ahụ bụ ndị na-ahụ ọhụ ụgha, na-agbakwa afa ụgha. Ha a gaghị esonye na otu ọgbakọ ndị m maọbụ bụrụ ndị agụnyekọrọ nʼakwụkwọ ndekọta aha ụlọ nke Izrel, ha agaghị abakwa nʼala ndị Izrel. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.


Ọ kpọpụtara ha nʼezi sị, “Ndị nwe m, gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan