Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 20:1 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe Pashua nwa Imea, bụ onye nchụaja, ma burukwa onyeisi na-elekọta ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, nụrụ amụma ndị a Jeremaya na-ebu,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

1 Pashua nwa Imea, bú onye-nchu-àjà, nke bu kwa onye-nlekọta, onye-ndú n'ulo Jehova, Pashua ahu we nu ka Jeremaia nēbu amuma okwu ndia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 20:1
11 Iomraidhean Croise  

Ọchịagha ndị nche eze ahụ, kpụụrụ Seraya, onyeisi nchụaja, na Zefanaya, bụ onye nchụaja na-esote ya nʼọkwa, na ndị nche atọ na-eche ọnụ ụzọ mbata.


nke iri na ise, Bilga nke iri na isii, Imea


Azaraya nwa Hilkaya, nwa Meshulam, nwa Zadọk, na Meraiot, nwa Ahitub. Azaraya bụ onye na-elekọta ụlọnsọ ukwu Chineke.


Ndịisi ya nyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị onyinye afọ ofufu. Otu a kwa, Hilkaya na Zekaraya, na Jehiel, ndị na-elekọta ụlọnsọ Chineke nyere ndị nchụaja puku ewu na atụrụ abụọ na narị isii, nyekwa ha narị oke ehi atọ, maka iji chụọ aja Ngabiga.


Ma gị onwe gị bụ Pashua, na ndị niile bi nʼụlọ gị, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa Babilọn. Nʼebe ahụ ka ị ga-anwụ. Ebe ahụ kwa ka a ga-eli gị, gị na ndị enyi gị ndị a niile ị na-eburu amụma ụgha.’ ”


‘Onyenwe anyị ahọpụtala gị mee gị onye nchụaja ga-anọchi anya Jehoiada. Nʼihi ya, ị bụrụla onyeisi ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ya mere, o kwesiri ka i jide onye ara ọbụla na-akpọ onwe ya onye amụma, manye ya agbụ igwe nʼụkwụ, na nʼolu ya.


Ha were iwe megide Jeremaya, nye iwu ka e tie ya ihe, kpọchiekwa ya nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ. Nʼihi na ha ji ụlọ ahụ mere ụlọ mkpọrọ nʼoge a.


Mgbe ha nọ na-agwa ndị mmadụ ahụ okwu, ndị nchụaja na onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu ahụ na ndị Sadusii bịakwutere ha.


Mgbe onyeisi ndị agha na-eche ụlọnsọ ukwu na ndịisi nchụaja nụrụ okwu ndị a, ọ gbara ha gharịị, ha na-eche ihe nke a ga-apụta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan