Jeremaya 2:8 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a8 Ndị nchụaja ajụghị sị, ‘Olee ebe Onyenwe anyị nọ?’ Ndị ikpe ha amaghị m, ndị na-achị ha mehiere megide m, ndị amụma ha bụkwa aha Baal ka ha ji ebu amụma, ha gbasooro ihe na-enweghị isi. Faic an caibideilBible Nso8 Ndi-nchu-àjà asighi, Òle ebe Jehova nọ? ọzọ, ndi ji iwum eme ihe amaghm: ndi-ọzùzù-aturu jehie-kwa-ra megidem, ndi-amuma ji-kwa-ra Beal bu amuma, ọ bu kwa ihe nādighi-abà urù ka ha jesoro. Faic an caibideil |
Ndị a kwa na-adagharị site na mmanya sitekwa nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya. Ndị nchụaja na ndị amụma na-adagharị site na ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya, mmanya emeela na ha amakwaghị ihe ha na-eme; ha na-adagharị site nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya ha na-adagharị mgbe ha na-ahụ ọhụ dị iche iche, ha na-asọ ngọngọ mgbe ha nʼekpe ikpe.
Ndị nchụaja ya na-enupu isi nʼiwu m niile, mee ka ihe nsọ m niile gharakwa ịdị nsọ, nʼebe nsọ m. Ha adịghị akpakwa oke nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ. Ha na-ezi ndị m na ihe dị iche ọbụla adịghị nʼetiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha. Ha adịghị akpọkwa ụbọchị izuike m ihe ọbụla. Nʼihi ya, e mere ka m ghara ịdịkwa nsọ nʼetiti ha.