Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 2:5 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nna unu ha chọpụtara nʼime m, mere ha ji si nʼebe m nọ kpafuo, nọrọ m ebe dị anya? Nke mere na ha ghọrọ ndị nzuzu site nʼịgbaso arụsị?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

5 otú a ka Jehova siri, Àjọ omume gini ka nna-unu-hà huworo n'arum, na ha esiwo n'ebe M'nọ je n'ebe di anya, we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 2:5
24 Iomraidhean Croise  

Ha jụrụ ụkpụrụ ya niile na ọgbụgba ndụ ya, nke ya na ndị bụ nna nna ha gbara na iwu nke ọ dọrọ ha aka na ntị ka ha debe. Ha gbasooro chi arụsị bụ ihe efu, ha onwe ha ghọkwara ihe efu. Ha ṅomiri mba dị iche iche ndị ahụ bi ha gburugburu, nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị nyere ha iwu sị, “Unu emela dịka ha.”


Ndị na-eme ha ga-adịkwa ka ha. Ndị na-atụkwasị ha obi ga-adịkwa ka ha.


Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a ji ọnụ ha na-abịa m nso, ha ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. Ofufe ha na-efe m, bụ nke gbadoro ụkwụ nʼihe mmadụ nyere nʼiwu, bụkwa nke a kuziiri ha.


Ndị a niile na-apị arụsị bụ ndị nzuzu. Chi ndị ahụ niile ha na-agụ dị ka ihe ukwu bụkwa ihe na-enweghị isi. Ndị niile na-akpọ isiala nye chi ndị a bụ ndị kpuru ìsì, na ndị amamihe kọrọ, ndị ihere ga-emekwa.


Geenụ m ntị, unu ndị isi ike, unu ndị nọpụrụ ezi omume m nʼebe dị anya.


Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu. Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe.


Ị kụọla ha ka osisi, ha agbaala mgbọrọgwụ; ha na-etokwa na-amị mkpụrụ. Ị nọ nso mgbe niile nʼọnụ ha, ma ị nọ nʼebe dị anya nʼobi ha.


Ọ dị chi ihe efu nke ndị mba ọzọ nwere ike ime ka mmiri zoo? Mbara eluigwe ọ pụrụ ime ka mmiri zoo site nʼike aka ya naanị? Mba! Ọ bụ gị, Onyenwe anyị Chineke anyị pụrụ ime ihe ndị a. Nʼihi nke a, olileanya anyị dị nʼime gị, nʼihi na ọ bụ gị na-eme ihe ndị a niile.


“Unu ndị ọgbọ a, tuleenụ okwu nke Onyenwe anyị: “O nweela mgbe m bụ ọzara nye ndị Izrel ma ọ bụkwanụ ala gbara oke ọchịchịrị? Gịnị mekwaranụ ndị m ji na-asị, ‘Anyị enwerela onwe anyị ịwagharị, anyị agaghị abịakwutekwa gị ọzọ’?


Nụrụ okwu nke Onyenwe anyị unu ụlọ Jekọb, na unu ndị bụ agbụrụ niile sitere nʼIzrel.


Gee ntị nụrụ akwa ndị m ka ọ na-ada site nʼebe dị anya. “Onyenwe anyị, ọ sitela na Zayọn pụọ? Ọ pụtara na Eze ha anọkwaghị nʼebe ahụ?” “Gịnị mere ha ji site nʼoyiyi a tụrụ atụ, na arụsị ndị mba ọzọ ha na-efe kpasuo m iwe?”


“Nwa nke mmadụ, ụmụ nke nna gị, ọ bụladị ụmụnna gị, na ndị mgbapụta gị na ezinaụlọ Izrel niile, ọ bụ ha ka ndị bi na Jerusalem sịrị, ‘Ha esitela nʼebe Onyenwe anyị nọ gaa ebe dị anya, ọ bụkwa anyị ka enyere ala nke a ka ọ bụrụ ihe nnweta anyị,’


Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi nwetaghachikwa obi ndị Izrel niile bụ ndị si nʼebe m nọ wezuga onwe ha, ma malite ife arụsị.’


“Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara, na-agbakụta ebere Chineke azụ.


“ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.


na-asị, “Ndị ikom, gịnị ka unu na-achọ ime? Lee, anyị bụkwa mmadụ dị ka unu. Ọ bụ oziọma ka anyị wetaara unu. Anyị chọrọ ka unu site nʼịsọpụrụ ihe ndị a na-abaghị uru, bịakwute Chineke dị ndụ. Onye kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri na ihe niile dị nʼime ha.


Ọ bụ eziokwu na ha maara Chineke, ma ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye ya ekele dịka Chineke. Echiche uche ha bụ ihe efu, nzuzu ha mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị.


Ha esitela nʼihe na-abụghị chi kpalie ekworo m, jiri arụsị ha na-abaghị uru mee ka iwe wee m. Mụ onwe m ga-esite na ndị na-abụghị ndị kpalie ekworo ha, sitekwa na mba na-enweghị nghọta kpalie iwe ya.


Unu agbasola chi ndị ọzọ, nʼihi na ha abaghị uru. Ha agaghị enyere unu aka maọbụ napụta unu site nʼaka ndị iro unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan