Sị ha, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda, na ndị Jerusalem. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke Izrel kwuru. Geenụ ntị! Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ala a, ụdị ihe ọjọọ ga-eme ka ntị ọbụla nụrụ ya zụọ wuruwuru.
Izrel bụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị, mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ya. Ndị niile ripịara ya ka a gụrụ dị ka ndị ikpe mara. Ihe ọjọọ dakwasịkwara ha.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nna unu ha chọpụtara nʼime m, mere ha ji si nʼebe m nọ kpafuo, nọrọ m ebe dị anya? Nke mere na ha ghọrọ ndị nzuzu site nʼịgbaso arụsị?
“Ị hụla ajụjụ ndị a na-ajụ? Ha na-ajụ na-asị, ‘Onyenwe anyị ọ jụla agbụrụ abụọ ndị a ọ họpụtara?’ Nʼihi ya, ha na-elelị ndị m, ha adịghị agụkwa ha dịka mba.
Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel, nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubo megide unu ndị bi nʼala a. “Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya, ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.