Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 2:25 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Agbala ọsọ ruo mgbe ị ga-agbara ụkwụ efu, mgbe akpịrị ga-akpọ gị nku. Ma ị na-asị, ‘O nweghị uru ọ bara. Nʼihi na ahụrụ m chi ndị mba ọzọ nʼanya, aghaghị m ịgbaso ha.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

25 B͕ochie ukwu-gi n'ibà ukwu efu, b͕ochi kwa akpiri-gi n'ikpọ-nku: ma i siri, Ntukwasi-obi adigh: é-è; n'ihi na ahuwom ndi ala ọzọ n'anya, ha ka m'gējeso kwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 2:25
27 Iomraidhean Croise  

Nʼoge nsogbu ya, eze Ehaz gakwara nʼihu bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị.


Ọ chụrụ aja nye chi niile nke Damaskọs, bụ ndị meriri ya nʼagha. Ọ sịrị, “Nʼihi na chi nke ndị eze Aram nyeere ha aka, ha ka m ga-achụrụ aja, ka ha nwee ike nyere m aka.” Ma ha bụ ihe wetaara ya ọdịda, bụrụkwa ọdịda nye Izrel niile.


Gị, bụ Onyenwe anyị, Ị gbakụtala ndị gị, bụ ụlọ Jekọb azụ. Nʼihi na ha jupụtara nʼikpere arụsị nke si nʼọwụwa anyanwụ. Ha na-ajụkwa ase dịka ndị Filistia. Ha na ndị na-ekpere arụsị na-ejikọkwa aka.


Oke mwagharị ndị a niile emeela ike gwụsịa gị, ma ị dịghị asị, ‘Olileanya adịghị.’ Ị chọtara ntute nye ndụ gị, ya mere, na ị daghị mba.


Gịnị ka ị ga-asị mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị ahụ ị gụrụ dịka ndị enyi gị bịa buso gị agha? Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gị ọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme?


Mgbe ahụ, ị ga-ajụkwa obi gị ajụjụ sị, “Gịnị mere ihe ndị a ji dakwasị m?” Ọ bụ nʼihi ịba ụba nke mmehie gị ka e ji dọwaa uwe mwụda gị, merụọ gị ahụ nʼakụkụ ahụ gị niile.


Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere ndị a, “Ha hụrụ mwagharị nʼanya nke ukwuu. Ụkwụ ha adịghị anọkwa nʼotu ebe. Nʼihi nke a, ihe banyere ha adịghị atọkwa Onyenwe anyị ụtọ. Ugbu a kwa ka ọ na-echeta ajọ omume ha, ọ ga-atakwa ha ahụhụ nʼihi mmehie ha.”


Ma ha ga-aza sị, ‘O nweghị isi! Anyị ga-anọgide na-eme ihe ọbụla anyị chepụtara nʼechiche anyị, na-emekwa atụmatụ isiike nke obi ọjọọ anyị tụpụtara.’ ”


“Unu ndị ọgbọ a, tuleenụ okwu nke Onyenwe anyị: “O nweela mgbe m bụ ọzara nye ndị Izrel ma ọ bụkwanụ ala gbara oke ọchịchịrị? Gịnị mekwaranụ ndị m ji na-asị, ‘Anyị enwerela onwe anyị ịwagharị, anyị agaghị abịakwutekwa gị ọzọ’?


“Gbagoruo na Lebanọn tie mkpu akwa, meenụ ka a nụ olu unu na Bashan, sitekwanụ na Abarim tie mkpu akwa nʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma.


Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm, ma ị jụrụ ige ntị. Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ị jụkwara irubere m isi.


Naanị nabata na ị bụ onye ikpe mara, na i nupula isi megide Onyenwe anyị, bụ Chineke gị. Kwupụta na i werela onwe gị kesara ndị mba ọzọ dị iche iche nʼokpuru osisi ndụ niile, na ị jụkwara irubere m isi.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.


Nʼihi na anyị aghaghị ime ihe ndị ahụ anyị kpebiri ime. Anyị ga-achụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Anyị ga-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ dịka anyị na nna anyị ha, ndị eze anyị na ndịisi ọchịchị anyị mere nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem. Nʼoge ahụ, anyị na-eriju afọ, ihe na-agakwara anyị nke ọma, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị anyị.


Ọ na-akwasị akwa ike nʼabalị, anya mmiri na-asọdakwa na nti ya, nʼetiti ndị ahụ niile hụrụ ya nʼanya, ọ dịghị onye na-akasị ya obi. Ndị enyi ya niile aghọgbuola ya; ha niile aghọọla ndị iro ya.


Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ ya nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ. Ụmụntakịrị na-arịọkwa ka e nye ha nri, ma o nweghị onye na-enye ha nri ahụ.


“ ‘Unu na-ekwu nʼobi unu sị, “Anyị chọrọ ịdị ka mba ndị ọzọ, dịka agbụrụ ndị ọzọ nọ nʼụwa, ndị na-akpọ isiala nye osisi na nkume.” Ma ihe unu bu nʼobi agaghị emezu.


Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ, aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya. Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara, ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ, were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ.


Nʼihi na nne ha bụ onye na-akwa iko, ọ tụrụ ime ha nʼọnọdụ ihere. Site nʼikwu sị, ‘Aghaghị m ịgbakwuru ndị enyi nwoke hụrụ m nʼanya, ndị na-enye m nri na mmiri, ajị anụ m na akwa ọcha m, mmanụ oliv m na ihe ọṅụṅụ m.’


“Unu ekwuola sị, ‘Ọ bụ ihe nzuzu ife Chineke ofufe, na ịtụ ya egwu. Gịnị bụ uru anyị na-erite site nʼidebe iwu ya, na ijegharị dịka ndị na-eru ụjụ nʼihu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile?


“Ma nna ya gwara ndị ohu ya sị, ‘Meenụ ngwangwa weta uwe kachasị mma yikwasị ya. Gbanye ya ọlaaka nʼaka, yinyekwanụ ya akpụkpọụkwụ nʼụkwụ.


Ọ kpọkuru Ebraham sị ya, ‘Nna m Ebraham, meere m ebere nʼihi na anọ m nʼoke ihe mgbu nʼime ọkụ a. Biko zienụ Lazarọs ka ọ denye mkpịsịaka ntakịrị ya na mmiri bịa mejụọ ire m.’


Nʼihi na a zọpụtara anyị site nʼolileanya dị otu a. Ma olileanya a na-ahụ anya abụghị olileanya. Onye na-enwe olileanya mgbe ihe ọ na-ele anya ya dị ya nʼaka?


Ya mere, nʼọnọdụ agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ, nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ụkọ ka ị ga-efe ndị iro ahụ Onyenwe anyị na-ezite imegide gị. Ọ ga-anyakwasị yoku igwe nʼolu gị ruo mgbe ọ lara gị nʼiyi.


Ha sitere na chi ndị ala ọzọ ha kpasuo ekworo ya, meekwa ka iwe wee ya nʼihi ihe arụ nke arụsị ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan