Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 2:22 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Nʼagbanyeghị na iji ncha sachaa onwe gị, maọbụ jirikwa ọtụtụ ntụ ncha, ntụpọ nke mmehie gị ka dị nʼihu m,” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

22 N'ihi na ọ buru na i ji akanwu sa aru, i were kwa n'onwe-gi ọtutu nchà, ma akaworo ajọ omume-gi n'irum, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 2:22
12 Iomraidhean Croise  

Devid gwara ya sị, “Ọ dị mma, nọdụ nʼebe a taa, echi ị ga-alaghachikwa nʼọgbọ agha.” Ụraya kwenyere nọdụ na Jerusalem ụbọchị ahụ, nakwa ụbọchị na-eso ya.


A ga-ekechi njehie m nʼakpa, ị ga-ekpuchi mmehie m.


O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile, Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo?


Ị gbasaala njehie anyị niile nʼihu gị. Ị na-ahụzukwa mmehie nzuzo anyị niile.


Ana m ahụzu ụzọ ha niile. O nweghị ihe zoro ezo nʼebe m nọ. Anya m na-ahụzukwa mmehie ha niile.


“E ji mkpisi igwe gbunye mmehie Juda, jikwa ọnụ nkume siri ike a pịrị ọnụ ya apị, depụta nʼelu mbadamba nkume, bụ obi ha, nakwa nʼelu mpi niile nke ebe ịchụ aja ha.


Jerusalem, sachapụ mmehie dị gị nʼobi, ka a zọpụta gị. Ruo ole mgbe ka echiche mmehie ga-ejupụta gị obi?


“ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Ahụhụ dịrị obodo ahụ a na-awụsi ọbara nʼime ya. E, ahụhụ dịrị ite ahụ nchara dị nʼime ya, nke a na-apụghị ịsachapụ nchara ya. Wepụtasịanụ ha nʼotu nʼotu. Ka a hapụ ifekwa nza mgbe a na-eme nke a.


Njehie nke Ifrem ka e kechikọtara debe; a na-edetukwa mmehie ya niile nʼakwụkwọ.


Onyenwe anyị ewerela nganga Jekọb ṅụọ iyi, “Nʼezie, agaghị m echefu, ọ bụladị otu nʼime ọrụ niile ha rụrụ.”


“Nke a ọ bụghị ihe m dokọtarala chere oge, chezie ha nke ọma nʼụlọakụ m?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan