Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 2:21 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ma mụ onwe m kụrụ gị dịka osisi vaịnị kachasị mma nke mkpụrụ ya dị ndụ dịkwa mma. Olee otu i siri tụgharịa megide m, ghọọ ihe rụrụ arụ, osisi vaịnị ọhịa?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

21 Ma Mu onwem kuru gi-ri osisi vine kachasi nma, nkpuru nke bu nání ihe ziri ezi: ì si kwa aṅa b͕anwe orù osisi vine nke ala ọzọ n'ebe M'nọ?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 2:21
27 Iomraidhean Croise  

Nʼihi na ahọpụtala m ya, ka ọ tụziere ụmụ ya na ụlọ ya ndị ga-esote ya ịgbaso ụzọ Onyenwe anyị site nʼime ihe dị mma na ihe ziri ezi, ka Onyenwe anyị mezuoro Ebraham ihe niile o kwere ya na nkwa.”


Nwoke ahụ zara sị ya, “Aha gị agaghị abụkwa Jekọb, kama ọ ga-abụ Izrel, nʼihi na gị na Chineke na ndị mmadụ gbara mgba, ị mmeri.”


unu ụmụ ụmụ Ebraham, bụ ohu ya, unu ụmụ ụmụ Jekọb, ndị ọ họpụtara.


I ji aka gị chụpụ ndị mba ọzọ, ma kụnye nna nna anyị ha dịka osisi. I gwepịara ndị ahụ ma mee ka ndị nna anyị na-eto na-awasa.


I sitere nʼala Ijipt wepụta osisi vaịnị; ị chụpụrụ mba ndị ọzọ, kụọ ya.


Ị sụchaara ya ala, mgbọrọgwụ ya bara nʼime ala nke ọma, o jupụtakwara ala ahụ niile.


Gị onwe gị ga-akpọbata ha, kụọ ha dịka mkpụrụ, nʼelu ugwu nke ihe nketa gị. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị, i mere ka ọ bụrụ ebe obibi gị, ebe nsọ ahụ, Onyenwe anyị, nke i ji aka gị tọọ ntọala ya.


Lee ka obodo ahụ kwesiri ntụkwasị obi aghọọla onye akwụna! Ọ bụ nke jupụtararị nʼikpe ziri ezi; ezi omume na-anọbu nʼime ya, ma ugbu a, ọ bụzi ndị ogbu mmadụ.


Nʼụbọchị ahụ, abụ a ga-adị nʼọnụ ha, abụ ha ga-abụ banyere ubi vaịnị nke na-amị ezi mkpụrụ.


“Ma gị onwe gị, Izrel, ohu m, Jekọb, onye m họpụtara, gị mkpụrụ Ebraham, bụ enyi m.


Olee ihe ọzọ m gaara emere ya karịa ihe m mere? Gịnị mere ubi vaịnị m ji mịara m mkpụrụ jọrọ njọ nʼọnọdụ mkpụrụ na-atọ ụtọ?


Mgbe ahụ, ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume, ha ga-enwetakwa ala ahụ ruo ebighị ebi. Ha bụ ome nke m kụrụ, bụ ọrụ aka m, ime ka ịma mma m pụta ìhè.


na igboro ndị niile na-eru ụjụ na Zayọn ihe na-akpa ha. O zitere m inye ha okpueze mara mma nʼọnọdụ ntụ, inye ha ọṅụ, nʼọnọdụ ịkwa akwa, na iyikwasị ha mmụọ otuto nʼọnọdụ mmụọ ịda mba. Nʼihi na Chineke akụọla ezi omume nʼime ha, dịka osisi ook siri ike, igosi ịma mma Onyenwe anyị.


Aha Onyenwe anyị nyere gị bụ Osisi oliv dị ndụ, nke na-amị mkpụrụ mara mma. Ma ọ bụ olu mkpọtụ nke oke mmiri ozuzo ka ọ ga-eji mụkwasị gị ọkụ; alaka gị ga-agbajisikwa.


Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye ahụ kụnyere gị nʼala, e nyela iwu na mbibi ga-abịakwasị gị, nʼihi na ndị Izrel na Juda emeela ihe ọjọọ, kpasuo m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal.


“Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya, ma unu emebila ya kpamkpam. Gbajisienụ alaka ya nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị.


Lee ka ọlaedo si chuo echu. Lee ka ọlaedo makarịsịrị mma si gbanwee ghọọ ihe na-amakwaghị mma. Nkume niile dị oke ọnụahịa nke ebe nsọ bụ ndị a ghasara nʼisi okporoụzọ niile.


“Nwa nke mmadụ, olee, ụzọ osisi vaịnị si pụọ iche site nʼalaka osisi ndị ọzọ dị nʼime oke ọhịa?


“Ugbu a geekwanụ ntị nʼilu ọzọ. Otu onye dị nke nwere ala ubi. Ọ kụrụ osisi vaịnị nʼubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, gwuokwa ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼime ya. O wukwara ụlọ elu nʼime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nʼaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa nʼala ọzọ.


Mgbe ahụ, ọ bidoro ịgwa ndị ahụ okwu nʼilu sị, “Otu nwoke kụrụ mkpụrụ vaịnị nʼubi ya, jiri mgbidi gbaa ubi ahụ gburugburu. O gwuru ebe ịnara mmanya si na mkpụrụ vaịnị, wuokwa ụlọ elu. Mgbe o mesịrị, o nyefere ubi vaịnị ahụ nʼaka ndị ọrụ ubi ilekọta ya ma gaa obodo ọzọ.


Ọ gara nʼihu tụọrọ ndị mmadụ ilu a sị, “Otu nwoke nwere ubi vaịnị, nke o nyefere nʼaka ndị ga-elekọta ya anya ma pụọ gaa njem nʼala ọzọ ebe ọ nọrọ ogologo oge.


“Mụ onwe m bụ ezigbo osisi vaịnị ahụ. Nna m bụkwa onye ọrụ ubi.


Osisi vaịnị ha si nʼosisi vaịnị Sọdọm, na nʼubi dị na Gọmọra mkpụrụ vaịnị ha jupụtara na nsi, ụyọkọ vaịnị ha jupụtara nʼilu ilu.


Nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe nna nna unu nọ na nʼihi nhọpụta ọ họpụtara ụmụ ụmụ ha, ka o ji si nʼIjipt dupụta unu nʼihu ya. Ọ bụkwa ike aka ya ka o ji mezuo nke a.


Ndị Izrel fere Onyenwe anyị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, ndị maakwara ihe niile nke Onyenwe anyị rụụrụ ndị Izrel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan