Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 2:13 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 “Nʼihi na ndị m emeela ihe ọjọọ abụọ. Ha agbakụtala m azụ, bụ Isi iyi mmiri ndụ, gwuoro onwe ha ebe ichebe mmiri nke tipuru etipu na-enweghị ike ịnagide mmiri ọbụla.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

13 N'ihi na ihe ọjọ abua ka ndim meworo; Mu ka ha rapuworo, bú isi-iyi nke miri nēnye ndu, ka ha we gwuwara onwe-ha olùlù-miri di iche iche, bú olùlù-miri tipúru etipú, nke nānagideghi miri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 2:13
49 Iomraidhean Croise  

Nʼihi na ha ajụla m, gbakụta m azụ, chụọ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, kpasuo m iwe site na arụsị niile nke aka ha mepụtara. Iwe m ga-adị ọkụ megide ebe a, ọ gaghị akwụsịkwa.’


Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị; ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè.


Enyochaala m ihe niile a na-eme nʼụwa chọpụta na ha enweghị isi. Ọ dị ka mmadụ ịchụgharị ifufe.


Ihe efu, ihe niile bụ ihe efu ka onye ozizi na-ekwu. Ihe na-enweghị isi ka ihe niile bụ. Ihe niile bụ nnọọ ihe efu.


“Ihe efu! Ihe efu!” ka onye ozizi kwuru. “Ihe niile bụ ihe efu!”


Mgbe m tulere ihe banyere ihe ndị a niile m tinyetụrụ aka, otu m si dọgbuo onwe m nʼọrụ banyere ha, mkpebi m bụ na ha niile bụ ihe efu, dịka ịchọ ijide ifufe. Nʼezie, ihe niile bụ ihe efu, ha abakwaghị uru.


Nʼihi na mmadụ nwere ike jiri amamihe, na ihe ọmụma na ǹka dọgbuo onwe ya nʼọrụ, emesịa, ha ahapụrụ onye na-enweghị mgbe ọ rụrụ ọrụ ọbụla ihe ndị ahụ niile. Nke a bụkwa ihe efu, na oke ihe ndakwasị.


Nʼihi na ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ, ka Chineke na-enye amamihe na ihe ọmụma, na ọṅụ; ma ọ na-enye onye mmehie ọrụ ịkpakọta na ịchịkọba akụnụba nke ọ ga-enyefe nʼaka onye ahụ ihe ya dị Chineke mma. Nke a bụkwa ihe efu; ịchụso ifufe.


Achọpụtakwara m na ihe mere ndị mmadụ ji na-adọgbu onwe ha nʼọrụ bụ nʼihi anya ụfụ ha nwere nʼebe ihe ndị agbataobi ha dị. Nke a bụ ihe efu, ịchụso ifufe.


Ehi maara onyenwe ya, ịnyịnya ibu makwaara ebe onyenwe ya na-anọ azụ ya nri, ma Izrel amaghị m, ndị m adịghị aghọtakwa.”


Ahụhụ dịrị mba ndị mmehie, ndị ajọ omume riri ahụ, ụmụ ndị ajọ omume, ụmụ ndị nyefere onwe ha na mmerụ! Ha agbakụtala Onyenwe anyị azụ, ha elelịala Onye dị Nsọ nke Izrel, ha agbakụtala ya azụ ha.


Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta.


Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ, nʼihi amaghị ihe; ndị ọkwa ha dị elu ga-anwụ nʼihi agụụ, ndị mmadụ efu ga-abụ ndị akpịrị ga-akpọ nkụ nʼihi agụụ mmiri.


Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri? Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ? Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nri mkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma!


Nʼihi na Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a bụ nke m; e, ha agakwaghị agọnarị m ọzọ.” Ya mere, ọ ghọọrọ ha Onye nzọpụta.


Aga m ekwupụta ikpe niile m megide ha, nʼihi ajọ omume ha niile nʼịgbakụta m azụ, na isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, nakwa ịkpọ isiala nye ihe ndị ahụ niile ha ji aka ha kpụọ.


Ndị a na-asọpụrụ na-ezipụ ndị ohu ha ịga chọta mmiri. Ha na-aga nʼolulu mmiri ma o nweghị mmiri ha na-achọta. Ha bu ite nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya na-alọta. Ha ji aka ha kpuchie isi ha nʼihi ịda mba nke obi na nʼihi ọnọdụ obi ọjọọ nke ha nọ nʼime ya.


Gị onwe gị ajụla m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ị nọgidela na-adaghachi azụ. Ya mere, aga m ebikwasị gị aka, bibie gị. Ike m ji akwụsị gị ka ị ghara ịdaghachi azụ agwụla m.


Onyenwe anyị, olileanya Izrel ka ị bụ. A ga-emekwa ka ihere mee ndị na-agbakụta gị azụ. A ga-edekwa aha ndị ahụ niile si nʼebe ị nọ wezuga onwe ha nʼala, nʼihi na ha ewezugala onwe ha site nʼebe Onyenwe anyị, isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, nọ.


O nweela mgbe mmiri oyi m mere ka ọ kpụkọtaa kọrọ nʼelu ugwu Lebanọn? O nweela mgbe mmiri ya jụrụ oyi, nke si nʼebe dị anya na-asọdata ji akwụsị ịsọ asọ?


Nʼihi na ha ahapụla m, mee ka ebe a ghọọ nke chi ndị mba ọzọ. Ha achụọla aja nsure ọkụ nʼime ya nye chi ndị ahụ ha na nna nna ha, maọbụ ndị eze Juda, na-amaghị. Ha ejirila ọbara ndị aka ha dị ọcha mejupụta ebe a.


O nwerela mba gbanwere chi ndị ha na-efe? (Ọ bụ ezie na ha abụghị chi.) Ma ndị m ewerela arụsị na-enweghị isi gbanwere ebube ha.


Ọ bụghị unu onwe unu wetaara onwe unu ihe ọjọọ dị otu a site na ịhapụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, mgbe ọ na-edu unu na-aga nʼụzọ?


“Dịka a na-eme onye ohi ihe ihere mgbe e jidere ya, otu a ka a ga-eme ụlọ Izrel ihere, ha onwe ha, ma ndị eze ha, ma ndịisi ha, ndị nchụaja ha na ndị amụma ha.


“Ndị m bụ ndị nzuzu, ha amaghị m. Ha bụ ụmụntakịrị ndị na-enweghị uche, ha enweghị nghọta ọbụla. Ha bụ ọkachamara nʼihe gbasara ajọ omume, ma ha amaghị otu esi eme ezi ihe ọbụla.”


“E nwere ndị ajọ mmadụ nʼetiti ndị m, ndị na-edo onwe ha dịka ndị mmadụ na-esiri nnụnụ ọnya, dịka ndị na-esi ọnya ka ha nwude mmadụ.


Lee, ndị amụma na-ebu naanị amụma ụgha, ndị nchụaja na-achịkwa ndị m site nʼọchịchị nke nʼaka ike, ma lee, ndị m hụrụ ndụ dị otu a nʼanya. Gịnịkwa ka unu ga-eme nʼoge ikpeazụ.”


Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi nwetaghachikwa obi ndị Izrel niile bụ ndị si nʼebe m nọ wezuga onwe ha, ma malite ife arụsị.’


Mgbe ahụ, nwoke ahụ mere ka m lọghachikwa nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ. Ahụrụ m iyi nke na-asọ na-aga nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ (nʼihi na ihu ụlọnsọ ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ). Mmiri ahụ si nʼokpuru ụlọnsọ ukwu ahụ nʼakụkụ aka nri nke ebe ịchụ aja, nʼakụkụ ndịda ya na-asọpụta,


Ma ọ bụ unu na-ebili megide ndị m dịka ndị iro. Unu na-eyipụ ndị na-agafe agafe uwe ọma ha yi nʼahụ ha na-enweghị mmetụta, dịka a ga-asị na unu bụ ndị si nʼagha na-alọta.


“Unu bụ ndị m, gịnị ka m mere unu? Gwanụ m ụzọ m si boo unu ibu arọ? Zaanụ m.


“Nʼụbọchị ahụ, a ga-emeghe isi iyi mmiri nye ụlọ Devid na ndị niile bi na Jerusalem. Ọ ga-abụ isi iyi a ga-eji sachapụ mmehie na adịghị ọcha ha niile.


Jisọs zara sị, “Ọ bụrụ na ị matara onyinye Chineke, na onye ahụ na-arịọ gị mmiri, ị gaara arịọ ya, ọ gakwara enye gị mmiri nke ndụ.”


Nwanyị ahụ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, o nweghị ihe ọbụla i ji ị ga-eji dọrọ mmiri, olulu a dịkwa omimi. Oleekwanụ ebe ị ga-eweta mmiri ndụ a.


Ma onye ọbụla ga-aṅụ mmiri ahụ m nyere ya, akpịrị agaghị akpọkwa ya nkụ ọzọ. Nʼeziokwu, mmiri ahụ m nyere ya ga-aghọrọ ya isi iyi nke na-asọpụtara ya ndụ ebighị ebi.”


Nʼụbọchị ikpeazụ bụkwa ụbọchị kacha ibe ya nke mmemme ahụ, Jisọs guzooro ọtọ jiri oke olu tie mkpu sị, “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọbụla nkụ, ya bịakwute m bịa ṅụrụ mmiri.


Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ị ga-anwụ, jekwuru nna nna gị ha. Mgbe ị nwụrụ, ndị a ga-amalite ife chi ọzọ ofufe ndị dị nʼala ahụ ha na-abanye. Ha ga-agbakụta m azụ, mebie ọgbụgba ndụ mụ na ha gbara.


Ndị a dịkwa ka iyi tara ata nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya. Ha dịkwa ka igwe ojii nke oke ifufe na-efesasị, nke na-adịghị ezo mmiri ọbụla. Ndị a kwadobere ebe kachasị ịgba ọchịchịrị.


Ọ sịrị m, “E mezuola ihe niile. Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ. Aga m enye onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri nke si nʼisi iyi mmiri nke ndụ dịka ihe onyinye.


Mmụọ ozi ahụ gosiri m iyi ahụ e si ekute mmiri nke na-enye ndụ nke na-enwu dịka kristal. O sikwa nʼokpuru ocheeze Chineke na Nwa atụrụ ahụ na-asọpụta,


Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị, “Bịa!” Ka onye ọbụla nụrụ okwu a kwuo sị, “Bịa!” Onye akpịrị na-akpọ nkụ ya bịa, onye ọbụla chọrọ ya bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ na-akwụghị ụgwọ ọbụla.


Ma unu nọgidere na-agbakụta m azụ oge niile, na-efe chi ndị ọzọ ofufe. Ya mere, gawaranụ onwe unu, agaghị m anapụtakwa unu ọzọ.


Ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, sị ya, ‘Anyị emehiela, anyị agbakụtala Onyenwe anyị azụ, fee arụsị Baal na Ashtọret. Ma ugbu a, napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, anyị ga-efekwa gị.’


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan