Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 2:10 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Gafee nʼọnụ mmiri Saiprọs lee anya, zie ozi gaa Keda ma leruo anya nke ọma, ma ị ga-ahụ ihe ọbụla yiri nke a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

10 N'ihi na, gabiganu rue agwe-etiti nile nke Kitim, we hu; ziga-kwa-nu na Kida, we chigharia uche nke-uku; hu-kwa-nu ma ihe di otù a adiwo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 2:10
21 Iomraidhean Croise  

Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Ishmel nʼusoro ọmụmụ ha. Nebaiot bụ nwa mbụ ya. Ndị ọzọ bụ Keda, Adbel, Mibsam,


Ndị mmadụ ga-aza, ‘Nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị Chineke ha azụ, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt azụ, makụọ chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala na-efekwa ha ofufe. Ọ bụ nʼihi nke a ka O ji mee ka ihe ọjọọ niile ndị a bịakwasị ha.’ ”


Ụmụ ndị ikom Javan bụ: Elisha, Tashish, Kitim, na Rodanim.


Mgbe Devid ghọrọ nnọọ agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ, o mere Solomọn nwa ya, eze Izrel.


Ụmụ ndị ikom Kohat bụ Amram, Izha, Hebrọn na Uziel. Ha dị ndị ikom anọ.


Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek, nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda!


Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị m, “Tupu otu afọ agwụ, dị ka esi agụ afọ onye ohu e goro ọrụ, ịma mma Keda ga-agwụsị.


Nke a bụ amụma megide Taịa: Tienụ mkpu akwa, unu ụgbọ mmiri nke Tashish nʼihi na e bibiela Taịa, ahapụla ya na-enweghị ụlọ ọbụla maọbụ ọnụ mmiri mbata. Ozi erutela ha aka site nʼobodo Saiprọs.


Ọ sịrị, “Ị gaghị aṅụrị ọṅụ ịṅụ mmanya nʼoke oriri ọzọ, gị ada Saịdọn na-amaghị nwoke, nke a na-emegbu emegbu. “Bilie, gafee garuo Saiprọs, ọ bụladị nʼebe ahụ, ị gaghị enweta ezumike.”


Banyere Keda na alaeze Hazọ, nke Nebukadneza eze Babilọn busoro agha: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Bilienụ gaa buso Keda agha. Bibiekwanụ ndị ahụ niile bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.


Ị were uwe gị ụfọdụ, meere onwe gị ebe dị iche iche dị elu nke tụrụ agwa, ebe doziri ihe ndina ịkwa iko gị. Ihe dị otu a emetụbeghị mbụ, ha ekwesịkwaghị ime mgbe ọbụla.


“ ‘Arebịa na ụmụ eze niile nke Keda bụkwa ndị ahịa gị. Ọ bụ ụmụ atụrụ, na ebule, na mkpi, ka gị na ha nʼazụrịta na-erekwa.


Osisi ook nke si Bashan ka e ji mee ụmara gị niile. Osisi e si Saiprọs bubata ka e ji wuo ala ụgbọ gị, jirikwa ọdụ machie ya nʼọnọdụ ịchọ ya mma.


“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ị bụrụla onye nnupu isi karịa mba niile ndị gbara gị gburugburu. Ị jụkwara idebe iwu m na ịgbaso ụkpụrụ m, ọ bụghịkwa dịka iwu na atụmatụ nke mba dị iche iche nọ gị gburugburu ka ị mere.


Mgbe ọ mesịrị nke a, ọ ga-eche ihu ya nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼọnụ osimiri. Ọ ga-emerikwa ọtụtụ nʼime ha. Ma otu ọchịagha ga-alụso ya ọgụ, mee ka o jiri ọsọ gbaghachi nʼihere.


Ụgbọ mmiri ndị si obodo Kitim ga-abịa imegide ya, ọ ga-ada mba nʼihi egwu, ọ ga-alaghachi azụ were oke iwe megide ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ. Ọ ga-alọghachi gosi ndị hapụrụ ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ nkwado.


Ụgbọ mmiri ga-esi nʼọnụ mmiri Saiprọs bịa. Ha ga-eji ike dobe ndị Eba na ndị Ashọ nʼokpuru ha, ma a ga-ebibikwa ha onwe ha.”


Ọ bụ akụkọ doro anya na-enwe ịkwa iko nʼetiti unu, ụdị nke ndị na-ekweghị ekwe na-apụghị ime, ka unu na-eme. Otu onye nʼime ụlọ unu kpọọrọ nwunye nna ya, ha abụọ e biri.


Nʼihi nke a, Onye ọbụla hụrụ ihe ọjọọ a kwuru sị, “O nwebeghị onye ọbụla mere ụdị ajọ omume dị otu a kemgbe ụmụ Izrel si nʼobodo Ijipt pụta. Chee echiche banyere ihe a. Tulee ya ma gwa anyị ihe anyị ga-eme?”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan