Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 19:7 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 “ ‘Nʼebe a ka m ga-anọ laa nzube niile nke Juda na Jerusalem nʼiyi. Aga m eme ka ha daa site na mma agha nʼihu ndị iro ha, nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike. Aga m enye ụmụ anụ ufe na anụ ọhịa ozu ha dịka nri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

7 M'gāwusi kwa ndum-ọdu Juda na Jerusalem n'ebe a dika miri; M'gēme kwa ka ha da site na mma-agha n'iru ndi-iro-ha, na site n'aka ndi nāchọ ndu-ha: M'gēnye kwa ozu-ha iburu anu-ufe nke elu-igwe, na iburu anumanu nke uwa, ihe-oriri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 19:7
32 Iomraidhean Croise  

Aga m agbakụtakwa ndị fọdụrụ nʼihe nketa m azụ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha ga-aghọ ihe anaara nʼike, ghọọkwa ihe nkwata nʼagha nye ndị iro ha niile,


O nweghị amamihe dị, o nweghị nghọta dị, o nwekwaghị atụmatụ ọbụla, nke pụrụ iguzosi ike megide Onyenwe anyị.


Ya mere, otu ugboro ọzọ, aga m eme ndị a ihe oke iju anya jiri ihe ịtụnanya tụkwasị nʼelu ihe ịtụnanya, amamihe nke ndị maara ihe ga-ala nʼiyi, nghọta nke ndị nwere nghọta ga-agba barịị.”


Tụọnụ atụmatụ unu ma a ga-ekposa ya. Wepụtanụ atụmatụ unu ma ọ gaghị eguzo nʼihi na Chineke nọnyere anyị.


Ọ bụrụ na ha ajụọ gị si, ‘Ebee ka anyị ga-aga?’ Gwa ha na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Ndị e debere nʼihi ọnwụ ga-anwụ, ndị e debere nʼihi mma agha ka mma agha ga-egbu; ndị e debere nʼihi ụnwụ ka ụnwụ ga-egbu, otu a kwa, ndị e debere nʼihi ịdọta nʼagha, ka a ga-adọta nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.’


Nwanyị mụrụ ụmụ asaa ga-ada mba, kubie ume. Ọ ga-anwụ mgbe oge ya na-erubeghị, ihere ga-eme ya; ọ ga-abụkwa onye e wedara nʼala. Ma ndị fọdụrụ ndụ ka m ga-eme ka ha nwụọ site na mma agha ndị iro ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.


“Ha ga-anwụ site nʼajọ ọrịa nke ga-egbu ha niile. O nweghị onye ga-eru ụjụ nʼihi ha, a gaghị elikwa ha. Kama ha ga-adị ka unyi e kposara nʼala. Mma agha na ụnwụ ga-ala ha nʼiyi, ozu ha ga-abụkwa ihe oriri nye ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa nke ụwa.”


Ya mere, were ụmụ ha nyefee nʼaka ụnwụ. Werekwa ha onwe ha nyefee nʼaka mma agha. Mee ka ndị nwunye ha ghọọ ndị gba aka ụmụ na di. Meekwa ka e gbuo ndị ikom ha, ka mma agha gbukwaa ụmụ okorobịa nʼọgbọ agha.


Mgbe nke a mesịrị, Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, aga m ewere Zedekaya eze Juda, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị niile bi nʼobodo a, ndị mma agha na ụnwụ na ihe otiti ndị a na-egbughị, nyefee ha nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, na nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọsi ndụ ha ike. Ọ ga-eji mma agha gbuo ha. Ọ gaghị emere ha ebere, ọ gaghị egosikwa ha ọmịiko.’


A ga-eli ya dịka e si eli ịnyịnya ibu. A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo ya nʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem.”


were gị nyefee nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ gị ike, bụ ndị ahụ ị na-atụ ụjọ ha. Aga m enyefe gị nʼaka Nebukadneza eze Babilọn na ndị Kaldịa.


Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: Ejikerela m ugbu a inyefe obodo a nʼaka ndị Babilọn, na nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, onye ga-alụta ya nʼagha.


ka m ga-enyefe nʼaka ndị iro ha ndị na-achọ iwepụ ndụ ha. Ozu ha ga-abụ ihe oriri nye anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa.


Aga m enyefe ha nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike, bụ Nebukadneza eze Babilọn, na ndịisi ọchịchị ya. Ma nʼikpeazụ, aga m emekwa ka ndị mmadụ birikwa nʼime ya ọzọ, dịka e si biri nʼime ya na mgbe ochie.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.


Mgbe ahụ, ozu ndị mmadụ ndị a ga-aghọrọ ụmụ anụ ufe na anụ ọhịa ihe oriri. O nwekwaghị onye ga-anọ menye ha egwu chụpụ ha.


A ga-agbasapụ ha nye anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, bụ ihe ndị ahụ niile ha hụrụ nʼanya na ihe ha na-akpọ isiala nye. Bụkwa ihe ndị ahụ ha na-agbaso, nke ha na-ajụta ase site nʼaka ha, na-efekwa. A gaghị ekpokọta ọkpụkpụ ndị a niile, maọbụ lie ha nʼala. Kama ha ga-aghasara nʼala dịka unyi.


“ ‘Unu si aṅaa kwuo, “Ndị maara ihe ka anyị bụ, nʼihi na iwu Onyenwe anyị dị nʼaka anyị,” ebe ọ bụ na mkpisi akwụkwọ aghụghọ ndị ode akwụkwọ unu adịghị akọwa iwu ya otu o kwesiri?


A ga-eme ka ihere mee ndị maara ihe; a ga-eme ka ụjọ jupụta ha obi, meekwa ka ha maa nʼọnya. Ebe ọ bụ na ha ajụla okwu Onyenwe anyị, ọ bụ ụdị amamihe dị aṅaa ka ha nwere?


Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị ire ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyeghị iwu ka ọ dị otu ahụ?


Aga m eguzo megide unu nʼoge ibu agha, mee ka ndị iro unu merie unu nʼagha. Unu ga-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ unu ọsọ. Ndị kpọrọ unu asị ga-achịkwa unu.


Aga m ewebata mma agha nʼebe unu nọ, ịbọ ọbọ nʼihi ọgbụgba ndụ m unu mebiri. Mgbe unu ga-agba ọsọ gbaba nʼobodo unu, aga m ezite ihe mbibi ga-ebibi unu nʼebe ahụ. Aga m enyefekwa unu nʼaka ndị iro unu.


Ọ bụrụ na ọ dị otu a, anyị na-esite nʼokwukwe anyị mee ka iwu ghara ịdị ire? Mba! Kama anyị na-enye iwu ọnọdụ kwesiri ya.


Nʼihi na, ọ bụrụ na ndị a ga-enye ihe e kwere na nkwa bụ ndị na-edebe iwu, inwe okwukwe abakwaghị uru, nkwa ahụ enwekwaghị isi ọbụla.


Taa ka Onyenwe anyị ga-enyefe gị nʼaka m. Aga m etigbu gị, bepụkwa gị isi. Taa aga m ewere anụ ahụ ndị agha Filistia niile nyefee nʼaka ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe, na ụmụ anụ ọhịa niile nke ụwa. Ụwa niile ga-amatakwa na Chineke nọ nʼIzrel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan