Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 19:5 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ha ewuola ebe ịchụ aja dị elu nye chi Baal. Nʼelu ya kwa ka ha na-esure ụmụ ha dịka aja nye Baal, bụ nke m na-enyeghị nʼiwu, ekwughịkwa m ya, o nwekwaghị mgbe o ji bata m nʼobi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

5 ha ewuwo kwa ebe nile di elu nke Beal, isure umu-ha ndikom n'ọku ka ha buru àjà-nsure-ọku anāchuru Beal; nke M'nēnyeghi n'iwu, ekwughkwam ya, ọ bataghi kwa n'obim:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 19:5
14 Iomraidhean Croise  

Ha jiri ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom chụọ aja nsure ọkụ nye chi ndị mba ọzọ. Ha gakwara nʼaja ịjụ ase, na ịgba aja, si otu a nyefee onwe ha nʼaka ime ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị, si otu a kpasuo ya iwe.


O jikwa nwa ya nwoke chụọ aja nʼime ọkụ, ọ gbara aja, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, si otu a kpasuo ya iwe.


O surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ dị iche iche nʼime Ndagwurugwu nke Ben Hinom, surekwaa ụmụ ya nʼọkụ. Ọ gbasoro omenaala niile rụrụ arụ nke ndị mba ọzọ, ndị ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼihu ndị Izrel.


Ha wuru ebe dị elu dị iche iche na Ndagwurugwu nke Ben Hinom nye Baal, ebe ha nọ jiri ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom chụọ aja nye Molek. O nweghị mgbe m nyere ha iwu ime ihe dị otu a, o nweghị mgbe ajọ ihe dị otu a batara m nʼobi, nke i nye ha iwu ime ihe arụ dị otu a, nke ime ka Juda mehie.


Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Nʼihi na ị wụpụrụ agụụ nke anụ ahụ gị, kpugheekwa ọtọ gị nʼịkwa iko gị nke gị na ndị ị hụrụ nʼanya na-akwa, na nʼihi arụsị gị niile rụrụ arụ, nakwa nʼihi na ị nyere ha ọbara ụmụ gị,


E merụrụ ha site nʼonyinye ha, bụ, iji nwa mbụ ọbụla chụọ aja, ka m si otu a menye ha egwu ka ha mara na mụ onwe m bụ Onyenwe.’


“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ, echiche ọjọọ ga-abata nʼobi gị, mgbe ị na-atule ọtụtụ ihe dị iche iche nʼobi gị.


“Ihe ị rọrọ na nrọ, gị bụ eze, bụ ihe banyere ihe na-aga imezu nʼoge dị nʼihu. Onye ahụ na-ekpughe ihe nzuzo niile egosikwala gị ihe nke ga-eme.


“ ‘Ị gaghị enye nwa gị ka e jiri ya chụọrọ Molek aja. Nʼihi na i kwesighị imerụ aha Chineke gị. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.


Nʼụtụtụ echi ya, Balak kpọọrọ Belam, duru ya rigoo Bamot Baal. O sitere nʼebe ahụ hụ nsọtụ ọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel.


Efekwala Onyenwe anyị bụ Chineke gị dịka ha si efe chi ha, nʼihi na mgbe ha na-efe chi ha ofufe, ha na-eme ihe arụ dị iche iche nke Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụladị ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ka ha na-esure nʼọkụ nye chi ha dị iche iche dịka aja.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan