Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 19:3 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Sị ha, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda, na ndị Jerusalem. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke Izrel kwuru. Geenụ ntị! Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ala a, ụdị ihe ọjọọ ga-eme ka ntị ọbụla nụrụ ya zụọ wuruwuru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

3 si, Nurunu okwu Jehova, unu ndi-eze Juda, na ndi bi na Jerusalem; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ biakwasi ebe a, nke nti abua nke onye ọ bula nānu ya gāzu wuruwuru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 19:3
18 Iomraidhean Croise  

Mba niile ga-atụ egwu aha Onyenwe anyị, ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị.


Onyenwe anyị nọ nʼaka nri gị. Ọ ga-egwepịa ndị eze nʼụbọchị oke iwe ya.


Nʼihi nke a, unu ndị eze, bụrụnụ ndị nwere uche; ka nke a bụrụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye ndị na-achị achị nʼụwa.


Mgbe ọbụla o si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-eburu unu, maọbụ nʼụtụtụ, ehihie, maọbụ nʼabalị, oge niile, mgbe mgbe.” Mgbe ahụ, obi unu ga-aghọta okwu Chineke; ọ ga-ewetara unu ahụ ịma jijiji.


Gwanụ eze na nne eze okwu sị ha, “Sitenụ nʼocheeze unu rịdata, nʼihi na okpueze ọma unu ga-esi nʼisi unu dapụ.”


Gwa ha sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda na ndị Juda niile, na ndị niile bi na Jerusalem, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a apụ, na-abatakwa.’


“Ugbu a, gwa ndị Juda na ndị ahụ bi na Jerusalem, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Lee, ana m akwado mbibi nke ga-abịakwasị unu; ana m echekwa echiche ọjọọ megide unu. Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu site nʼụzọ ọjọọ ya chegharịa, ya meekwa ka ụzọ ya na omume ya zie ezi.’


“Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke nke Izrel sịrị, ‘Geenụ ntị! Ana m aga ime ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru okwu ya bịakwasị obodo a, na obodo nta niile gbara ya gburugburu, nʼihi na ha bụ ndị isiike, ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m.’ ”


Lee, ana m amalite ime ka mbibi bịakwasị obodo ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ma unu ga-esi aṅaa gbanarị ahụhụ? Unu agaghị agbanarị ahụhụ, nʼihi na ana m enye iwu ka e webata mma agha nʼetiti ndị niile bi nʼụwa. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’


“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel kwuru: ‘Geenụ ntị! Lee, ana m aga ime ka ihe ọjọọ bịakwasị Juda na ndị niile bi na Jerusalem, dịka m kwuru na ọ ga-adị. Nʼihi na agwala m ha okwu, ma ha jụrụ ige m ntị. Akpọrọ m ha oku, ma ha jụrụ ịza.’ ”


Ihe ndị a bịakwasịrị ha nʼihi ihe ọjọọ ha mere. Ha kpasuru m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na site nʼife chi ndị ọzọ, ndị ha onwe ha maọbụ nna nna ha na-amaghị.


Nụrụ, gị ụwa, lee, ana m aga iwetara ndị a ịla nʼiyi, nke bụ mkpụrụ atụmatụ ọjọọ ha niile, nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼokwu m. Ha jụkwara ịnabatara onwe ha iwu m.


“Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Oke mbibi, oke mbibi nke a na-anụbeghị ụdị ya mbụ. Lee, ka ọ na-abịa.


A ga-ekpe unu ikpe nʼihu ndị na-achị achị na nʼihu ndị eze nʼihi m. Ma nke a ga-enye unu ohere ịgwa ha ihe banyere m. E, nke a ga-enye unu ohere ịgba ama banyere m nye ndị mba ọzọ.


Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.


Onyenwe anyị gwara Samuel sị, “Lee, ana m aga ime ihe nʼIzrel nke ga-eme ka ntị nụrụ ya zụọ wuruwuru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan