Jeremaya 18:8 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a8 ọ bụrụ na mba ahụ m dọrọ aka na ntị esite na mmehie ha chegharịa, a gaghị ebibi ya dịka m si zube. Faic an caibideilBible Nso8 ọ buru na mba ahu nke M'kwuworo okwu bayere ya esi n'ihe ọjọ ya chigharia, M'gēchèghari kwa n'ihe ọjọ ahu nke M'chère ime ya. Faic an caibideil |
Gwa ha, ‘Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ọnwụ onye na-emebi iwu adịghị atọ m ụtọ, kama ọ na-atọ m ụtọ mgbe onye na-emebi iwu sitere nʼụzọ ya chegharịa dịrị ndụ. Chigharịanụ, sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu niile chigharịa. Nʼihi gịnị ka unu ga-eji nwụọ, unu bụ ụlọ Izrel?’
Nʼihi ya, o kpeere Onyenwe anyị ekpere sị, “O, Onyenwe anyị, nke a ọ bụghị ihe m kwuru, mgbe m nọ nʼala m? Ọ bụ ya mere m ji chọọ ịgbalaga na Tashish na mbụ nʼihi na amaara m na ị bụ Chineke onye na-eme amara, na onye jupụtara nʼobi ebere, na onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, nke bara ụba nʼịhụnanya, onye na-anaghị ata mmadụ ahụhụ dịka mmehie ya siri dị.
Ma mgbe ọbụla Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel onye ikpe, ọ na-anọnyere onye ikpe ahụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Ọ na-esitekwa nʼaka onye ikpe a napụta ụmụ Izrel nʼaka ndị iro ha nʼihi na Onyenwe anyị nwere obi ebere nʼahụ ụmụ Izrel, mgbe ha na-asụ ude, nʼihi mmegbu na mkpagbu niile ndị iro ha na-emegbu ha, ma na-akpagbukwa ha.