Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 18:4 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ma ite ahụ ọ chọrọ ịkpụ apụtaghị dịka ọkpụ ite si chọọ ya, nʼihi ya, ọ kpụkọtara ụrọ ahụ ọzọ, malitekwa ịkpụgharị ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

4 Ewe bibie ihe onye ahu ji urọ akpu n'aka ọkpu-ite ahu, o we kpu kwa ya ọzọ ihe di iche, dika o ziri ezi n'anya ọkpu-ite ahu ikpu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 18:4
5 Iomraidhean Croise  

“Ahụhụ na-adịrị mmadụ ahụ nke na-alụso onye kere ya ọgụ, mmadụ ahụ bụ otu mpekele ejuju nʼetiti mpekele ejuju niile dị nʼala. Ụrọ ọ na-ajụ onye ji ya akpụ ihe ajụjụ sị, ‘Gịnị ka i ji m akpụ?’ Ka ọrụ gị ọ ga-asị, ‘Lee, ọ dịghị aka abụọ o nwere’?


Ya mere, ebiliri m jee nʼụlọ ọkpụ ite, bịakwute ya mgbe ọ nọ na-arụ ọrụ na nkume ịkpụ ihe.


Mgbe ahụ okwu Onyenwe anyị ruru m ntị,


Ọ sịrị, “Ọ bụ na m apụghị ime unu dịka ọkpụ ite a mere, unu ụmụ Izrel?” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Dịka ụrọ si dị nʼaka ọkpụ ite ahụ, otu a ka unu onwe unu si dịrị nʼaka m, gị Izrel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan