Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 17:8 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ. Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ, akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya. Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị. Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

8 Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku miri, ọ bu kwa n'akuku osimiri ka ọ nāwasa nkpọrọgwu-ya, ọ dighi-atu kwa egwu mb͕e okpom-ọku nābia, ma akwukwọ-ya gābu akwukwọ ndu; ọzọ, n'arọ nb͕ochi miri-ozuzo ọ gaghi-echeb͕u onwe-ya, ọ gaghi-apu kwa n'imì nkpuru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 17:8
12 Iomraidhean Croise  

Mgbọrọgwụ m ga-eto rịda na mmiri, na igirigi ga-adakwasịkwa nʼalaka m abalị niile.


Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị, nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ.


Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya, nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ. Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma.


Ndị tụkwasịrị obi nʼakụnụba ha ga-ada, ma onye ezi omume ga-epupụta dịka akwụkwọ ndụ.


Onyenwe anyị ga na-edu gị mgbe niile. Ọ ga-eme ka afọ jụ gị nʼala kpọrọ nkụ, meekwa ka ị nọrọ nʼahụ isiike. Ị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke a na-agba mmiri nke ọma, dịka isi iyi na-adịghị ata ata.


na igboro ndị niile na-eru ụjụ na Zayọn ihe na-akpa ha. O zitere m inye ha okpueze mara mma nʼọnọdụ ntụ, inye ha ọṅụ, nʼọnọdụ ịkwa akwa, na iyikwasị ha mmụọ otuto nʼọnọdụ mmụọ ịda mba. Nʼihi na Chineke akụọla ezi omume nʼime ha, dịka osisi ook siri ike, igosi ịma mma Onyenwe anyị.


Aga m azọpụta gị. Ị gakwaghị ada site na mma agha kama ị ga-agbapụkwa na ndụ, nʼihi na ị tụkwasịrị m obi.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.


Tulee nʼobi gị ihe gbasara Asịrịa, nke bụ oke obodo bụrụkwa mba a maara aha ya. Ọ dị ka osisi sida nke Lebanọn, nke jupụtara nʼalaka mara mma, nke ọtụtụ alaka ya na-enye ndo, nke dị ezi ogologo, nke alaka ọnụ ya topụrụ tokarịa osisi ọhịa niile.


Mkpụrụ osisi dị iche iche ga-eto nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ. Akwụkwọ ha agaghị akpọnwụ akpọnwụ, mkpụrụ ga-adị nʼelu ha mgbe niile. Mkpụrụ ọhụrụ ga-adị nʼọnwa ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmiri si nʼebe nsọ ahụ na-agba ha mmiri. Mkpụrụ ha ga-abụ nri, akwụkwọ ha ga-abụkwa maka ịgwọ ọrịa.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan