Jeremaya 17:4 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a4 Ihe nketa ahụ m nyere gị ga-efunarị gị, nʼihi ihe i ji aka gị wetara onwe gị. Aga m emekwa ka ị bụrụ ohu ndị iro gị nʼala nke ị na-amaghị, nʼihi na ị kpasuola iwe m, ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe niile ebighị ebi.” Faic an caibideilBible Nso4 I gārapu kwa, ọbuná site n'onwe-gi, ihe-nketa-gi nke M'nyere gi; M'gēme kwa ka i fè ndi-iro-gi n'ala ahu nke i nāmagh: n'ihi na ọku ka unu muyeworo n'iwem, rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ gēre. Faic an caibideil |
Unu ụlọ Devid, otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Kpeenụ ikpe ziri ezi kwa ụtụtụ niile; napụtanụ ndị a na-emegbu emegbu site nʼaka ndị na-emegbu ha. Napụtakwanụ ndị a na-apụnara ihe ha nwere site nʼaka ndị na-apụnara ha ihe ndị a. Ọ bụrụ na unu emeghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu, dịka ọkụ nʼihi ajọ omume unu, ọ dịkwaghị onye pụrụ ime ka ọ kwụsị.