Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 17:10 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-enyocha obi, na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ, nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

10 Mu onwem, bú Jehova, nēnyocha obi, nānwa akuru, ọbuná inye onye ọ bula dika uzọ-ya nile si di, dika nkpuru nke omume-ya nile si di.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 17:10
39 Iomraidhean Croise  

mgbe ahụ, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Gbaghara ma meekwa; mesoo onye ọbụla dịka ihe niile ha na-eme si dị, ebe ọ bụ na ị maara obi ha niile, nʼihi na naanị gị maara obi mmadụ ọbụla,


“Ma gị, Solomọn nwa m, mara Chineke nke nna gị, jiri obi zuruoke, na mmụọ nwere njikere mgbe niile fee Onyenwe anyị ofufe, nʼihi na Onyenwe anyị na-enyocha obi mmadụ niile. Ọ na-aghọtakwa ihe niile anyị bu nʼobi na echiche niile. Ọ bụrụ na ị chọsie ụzọ ya ike, ị ga-achọta ya, ma ọ bụrụ na ị jụ ya, ọ ga-ajụ gị ruo ebighị ebi.


Amaara m, Chineke m, na ị na-anwale obi, na i na-enwekwa mmasị nʼihe ziri ezi. Ihe ndị niile ka m onwe m nyere site nʼafọ ofufu nakwa obi ziri ezi. Ma ugbu a, ahụla m ọṅụ ndị gị, bụ ndị nọ nʼebe a, ji were afọ ofufu nye gị onyinye ha.


mgbe ahụ, site nʼeluigwe bụ ebe obibi gị nụrụ arịrịọ ha. Gbaghara ma meekwa; mesoo onye ọbụla dịka ihe niile ha na-eme si dị, ebe ọ bụ na ị maara obi ha niile (nʼihi na naanị gị maara obi ụmụ mmadụ),


Ọ na-akwụghachi onye ọbụla dịka ihe o mere si dị, ọ na-ewetara mmadụ dịka omume ya kwesiri.


ọ bụ na Chineke agaraghị achọpụta ya, ebe ọ maara ihe nzuzo niile dị nʼobi?


Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji agba mgba, ogologo ụbọchị niile. A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.


na gị, Onyenwe anyị, jupụtara nʼịhụnanya. Nʼezie, ị ga-akwụghachi onye ọbụla dịka ọrụ ya si dị.”


Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ ọta m, ọ na-azọpụta ndị niile obi ha ziri ezi.


O Chineke onye ezi omume, onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ, mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebe meekwa ka ndị ezi omume guzosie ike.


Ikwu eziokwu na-enye mmadụ obi ụtọ, inwe mgbalị na-ewetara ya ngọzị.


Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma Onyenwe anyị na-anwale obi.


Nke a bụkwa ihe ọjọọ na-eme nʼokpuru anyanwụ. Otu ihe ndakwasị dịrị mmadụ niile. Ọzọkwa, obi ụmụ mmadụ jupụtara nʼihe ọjọọ na ịyị ara mgbe ha nọ na ndụ, emesịa ha alakwuru ndị nwụrụ anwụ.


Ọ ga-akwụghachi ndị iro ya dịka ajọ omume ha niile si dị. Iwe ọkụ ya ka ọ ga-eji megide ndị iro ya niile bi na mba dị anya.


Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, na-anwapụtakwa obi mmadụ na mmụọ ya. Mee ka m hụ mgbe ị ga-abọ ọbọ megide ha, nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m na-etinye okwu a metụtara m.


Ha ga-agha mkpụrụ ọka wiiti, maọbụ ogwu ga-epuru ha. Ha ga-adọgbu onwe ha nʼọrụ ma ha agaghị enweta ihe ọbụla. Ya mere, ka ihe ihere unu ghọtara dịka ihe ubi dịrị unu, nʼihi na ahụhụ ndị a sitere nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị.”


Ma gị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, gị, onye na-enyocha onye ezi omume, onye anya ya na-eru nʼihe dị mmadụ nʼobi na nʼime echiche uche ya, biko, kwere ka m dị ndụ hụ mgbe ị ga-abọrọ onwe gị ọbọ megide ha, nʼihi na ọ bụ nʼaka gị ka m tinyere ihe niile gbasara m.


Aga m enye gị ahụhụ nke ruuru gị nʼihi ajọ omume gị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m amụnye ọkụ nʼoke ọhịa gị niile, nke ga-erechapụ ihe niile dị gị gburugburu.’ ”


Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-agwa ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-elekọta ndị m, “Ebe ọ bụ na unu akpasasịala igwe ewu na atụrụ m, chụsaa ha, kama ilekọtazi ha anya nke ọma, aga m ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ ndị a unu mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.


Nzube gị dị ukwuu, otu a kwa akaọrụ gị dịkwa ukwuu. Anya gị ghere oghe nye ụzọ mmadụ niile. Ị na-akwụghachikwa onye ọbụla dịka ndụ ya na akaọrụ ya si dị.


Mgbe ahụ, Mmụọ nke Onyenwe anyị bịakwasịrị m sị m kwuo, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: otu a ka unu na-ekwukwa, unu ndị ndu ụlọ Izrel, ma amaara m ihe unu bụ nʼuche.


Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi nwetaghachikwa obi ndị Izrel niile bụ ndị si nʼebe m nọ wezuga onwe ha, ma malite ife arụsị.’


Ma ụwa ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼihi ndị bi nʼime ya, iji kwụọ ha ụgwọ ihe ọjọọ niile ha mere.


Nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya. Mgbe ahụ ka ọ ga-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.


Ka onyinye gị bụrụ na nzuzo. Mgbe ahụ, Nna gị, onye na-ahụ ihe dị na nzuzo ga-akwụghachi gị.


Ọ dịghị ya mkpa ka onye ọbụla gbaa akaebe banyere ụmụ mmadụ, nʼihi na ya onwe ya maara ihe dị nʼime mmadụ.


Ha kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ niile. Gosi anyị onye ị họpụtara nʼime mmadụ abụọ ndị a.


Ma gịnị bụ uru unu nwetara nʼoge ahụ site nʼọrụ ahụ niile unu rụrụ, bụ ihe ndị ahụ na-eme ka ihere mee unu? Ihe ndị ahụ na-eduba nʼọnwụ.


Chineke, onye na-enyocha obi mmadụ, amarala ihe Mmụọ Nsọ bụ nʼuche. Nʼihi na Mmụọ Nsọ na-arịọrọ ndị nsọ niile arịrịọ dịka Chineke si chọọ.


Ma nʼebe ụmụ ya nọ, aga m etigbu ha ka ha nwụọ. Nzukọ niile ga-amata na abụ m onye na-enyocha mmụọ na mkpụrụobi niile. Aga m akwụghachikwa onye ọbụla nʼime unu ụgwọ ọrụ kwesiri ọrụ ya.


Ahụrụ m ndị niile nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nʼihu ocheeze ahụ. E meghere akwụkwọ dị iche iche, meghekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nʼihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ kpee ndị a niile nwụrụ anwụ ikpe dịka ọrụ ha rụrụ si dị.


“Lee, ana m abịa ọsịịsọ! Ụgwọ ọrụ m ga-enye onye ọbụla dịka ọrụ ọ rụrụ si dị dịkwa m nʼaka.


Ma Onyenwe anyị zara Samuel sị ya, “Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. Onyenwe anyị adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma Onyenwe anyị na-ele anya nʼobi.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan