Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 16:5 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Abanyela nʼụlọ ọbụla a na-akwa ozu; abanyela maka iso ha ruo ụjụ, maọbụ maka igosi ha ebere, nʼihi na ewepụla m ngọzị m nʼịhụnanya m, na ọmịiko m site nʼebe ha nọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

5 N'ihi na otú a ka Jehova siri, Abala n'ulo nke ikwa-ozu, eje-kwa-la iti aka n'obi, egosi-kwa-la ha ebere i nwere n'aru ha: n'ihi na ewepuwom udom n'ebe ndi nka nọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ebere na obi-ebere nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 16:5
13 Iomraidhean Croise  

Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị, nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie.


Mgbe alaka osisi ndị ahụ kpọnwụrụ daa, ụmụ nwanyị ga-abịa chịkọtaa ha were ha kwanye ọkụ. Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enweghị nghọta. Ọ bụ nke a mere Onye kere ha adịghị emere ha ebere. Onye ahụ kpụrụ ha agakwaghị egosi ha obi ebere.


Ndị mbibi ga-ejupụta nʼelu ebe niile dị elu nke ọzara, nʼihi na mma agha Onyenwe anyị ga-esite nʼotu nsọtụ ala ahụ ruo na nsọtụ nke ọzọ, ripịa ndị niile dị na ya. O nweghị onye ọbụla udo ga-adịrị nʼala ahụ.


Aga m atụpịakwa ha, otu onye nʼelu ibe ya, nna na ụmụ ya nʼelu ibe ha kwa. Agaghị m ekwe ka obi ọmịiko, maọbụ obi ebere gbochie m ibibi ha.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.


Ya mere, aga m esite nʼala a tufuo unu. Aga m atụbanye unu nʼala ahụ unu na nna unu ha na-amaghị. Ebe ahụ ka unu ga-anọkwa fee chi ndị ọzọ ehihie na abalị. Nʼihi na agaghị m emere unu amara.’


Enweghị m udo, echezọkwaala m ihe ọganihu bụ.


Tupu ụbọchị ahụ, akwụbeghị ma ndị mmadụ ma ụmụ anụmanụ ụgwọ ọrụ ha. Ọ dịghịkwa udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼihi ndị iro ya, ebe m mere ka onye ọbụla bụrụ onye na-emegide ibe ya.


Nʼụbọchị ahụ, iwe m ga-adị ọkụ megide ha, aga m agbakụta ha azụ, zoo ihu m nʼebe ha nọ. A ga-alakwa ha nʼiyi. Ọdachi na ahụhụ dị iche iche ga-abịakwasị ha, nke ga-eme ka ha sị, ‘Chineke anyị anọkwaghị nʼetiti anyị, ọ bụ ya mere ọdachi ndị a ji bịakwasị anyị.’


Mgbe ahụ, ịnyịnya ọzọ na-acha ọbara ọbara pụtara. E nyere onye nọkwasịrị nʼelu ya ike iwepụ udo nʼụwa nakwa ime ka ụmụ mmadụ na-egburita ibe ha. E nyekwara ya mma agha dị ukwuu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan