Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 16:3 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụmụ ndị ikom niile na ụmụ ndị inyom niile a mụrụ nʼala a. Otu a ka ọ kwukwara banyere nne na nna ụmụntakịrị ndị a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

3 N'ihi na okwu di otú a ka Jehova kwuru bayere umu-ndikom baye-kwa-ra umu-ndinyom, ndi amuru n'ebe a, baye-kwa-ra nne-ha ndi muru ha, baye-kwa-ra nna-ha ndi muru ha n'ala nka, si,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 16:3
6 Iomraidhean Croise  

Aga m eme ka ọnụọgụgụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ baa ụba. Ha ga-ehi nne karịa aja dị nʼọnụ oke osimiri. Nʼetiti ehihie ka m ga-eme ka onye mbibi bịakwasị ndị bụ nne ụmụ okorobịa ha; na mberede ka m ga-eme ka nhụju anya na ihe oke egwu bịakwasị ha.


“Ị gaghị alụtara onwe gị nwunye, ị gaghị amụtakwa ụmụ ndị ikom na ndị inyom nʼebe a.”


Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Abanyela nʼụlọ ọbụla a na-akwa ozu; abanyela maka iso ha ruo ụjụ, maọbụ maka igosi ha ebere, nʼihi na ewepụla m ngọzị m nʼịhụnanya m, na ọmịiko m site nʼebe ha nọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.


Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụkwa Chineke Izrel kwuru, ‘Nʼihu gị, na nʼoge ndị a niile ị dị ndụ, ka m ga-eme ka ụzụ ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na nke ndị inyom na-alụ di na nwunye kwụsị.’


Ya mere, ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “Aga m etinye ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ ndị a si agafe. Nna na nwa ya ga-asọ ngọngọ nʼelu ya; otu a kwa, ndị agbataobi na enyi ha ga-ala nʼiyi.”


Gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga ime ka ebe nsọ m ghara ị dị nsọ, bụ ebe e wusiri ike nke unu ji na-anya isi, ihe na-amasị anya unu, nke ihe banyere ya na-atọ obi unu ụtọ. Ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom, ndị unu hapụrụ ga-ada site na mma agha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan