Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 16:12 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ma unu emesoola m mmeso ọjọọ karịa ụdị mmeso nna unu ha mesoro m. Lee ka unu niile nʼotu nʼotu si agbaso ụzọ isiike nke obi ọjọọ unu chepụtara, kama irubere m isi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

12 unu onwe-unu emewo kwa ihe ọjọ kari nna-unu-hà; n'ihi na, le, unu nējeso, onye ọ bula isi-ike nke obi ọjọ ya unu we ghara igem nti:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 16:12
22 Iomraidhean Croise  

Onyenwe anyị hụrụ otu ịba ụba nke ajọ omume mmadụ si dị ukwuu, hụkwa na echiche uche nke obi ya niile dị naanị nʼime ihe ọjọọ, mgbe niile.


Onyenwe anyị nụrụ isisi ụtọ nke aja nsure ọkụ ahụ kwuo nʼobi ya sị, “Agaghị m abụ ala ọnụ ọzọ nʼihi mmadụ, ebe ọ bụ na izuzu obi mmadụ bụ ime ihe ọjọọ site na mgbe ọ bụ nwata, agakwaghị m ala ihe niile e kere eke na-eku ume ndụ iyi ọzọ, dịka m mere.


Onye ajọ omume nwere ike mee narị mmehie bikwaa ogologo ndụ, ma amara m na ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu Chineke mma karịa, bụ ndị na-atụ egwu nʼihu Chineke.


Nke a bụkwa ihe ọjọọ na-eme nʼokpuru anyanwụ. Otu ihe ndakwasị dịrị mmadụ niile. Ọzọkwa, obi ụmụ mmadụ jupụtara nʼihe ọjọọ na ịyị ara mgbe ha nọ na ndụ, emesịa ha alakwuru ndị nwụrụ anwụ.


Ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m, ndị ahụ na-ejegharị nʼisiike nke obi ha na-agbaso chi ndị ọzọ na-efe ma na-akpọkwa isiala nye ha. Ha ga-adịka belịt a, nke na-abakwaghị uru ọbụla.


Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile, o nwekwaghị ngwọta. Onye pụrụ ịghọta ya?


Ma ha ga-aza sị, ‘O nweghị isi! Anyị ga-anọgide na-eme ihe ọbụla anyị chepụtara nʼechiche anyị, na-emekwa atụmatụ isiike nke obi ọjọọ anyị tụpụtara.’ ”


Nwoke a bụ Jehoiakin, ọ bụ ite tiwara etiwa, nke e lelịrị elelị, ihe onye ọbụla na-achọghị? Nʼihi gịnị ka a ga-eji tufuo ya na ụmụ ya, tụga ha na mba ha na-amaghị?


Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe ndị ahụ m nyere nʼiwu. Kama ha gbasoro ọchịchọ ọjọọ nke obi rụrụ arụ ha. Kama ịga nʼihu, ha daghachiri azụ.


Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe m nyere nʼiwu. Ha bụ ndị ntị ike, ndị nọgidere na-eme ihe ọjọọ karịrị nke nna nna ha mere.’


Kama, ha na-agbaso isiike nke obi ha, ha gbasoro chi Baal dịka nna nna ha si kuziere ha.”


Nna anyị ha mehiere, ma ha anwụọla. Ma ọ bụ anyị na-anata ntaramahụhụ kwesiri ịbụ nke ha.


“Nʼihi nke a, gwa ụlọ Izrel, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Unu ọ ga-emerụ onwe unu dịka nna nna unu ha mere site nʼịchụso oyiyi ihe arụ ha dị iche iche?


Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Juda, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha ajụla iwu Onyenwe anyị. Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya. Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie, bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro.


Site nʼoge nna nna unu ha, unu esitela nʼidebe iwu na ụkpụrụ m wezuga onwe unu. Unu adịghịkwa edebe ha. Ya mere, lọghachikwutenụ m, mụ onwe m ga-alọghachikwute unu.” Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. “Ma unu na-asị, ‘Anyị ga-esi aṅaa lọghachi?’


Nʼihi na ọ bụ nʼime obi mmadụ ka echiche ọjọọ niile si apụta, ya na ịkwa iko niile dị iche iche, izu ohi, igbu mmadụ,


Mgbe onye dị otu a nụrụ okwu ịṅụ iyi a, na ha ga-agọzi onwe ha, na-eche, “Ihe ga-agara m nke ọma, ọ bụ ezie na m nọgidere na-agbaso ụzọ isiike m.” Ha ga-eweta mbibi nye ala a gbara mmiri nke ọma nyekwa ala ahụ kpọrọ nkụ.


Elekwasịla nnupu isi ha na isiike ha anya, kama, cheta nkwa gị, nke i kwere ndị ohu gị, Ebraham, Aịzik, na Jekọb. Biko, agụnyela ndụ ọjọọ ha, na mmehie ha megide ha.


Ma ndị mmadụ ọjọọ na ndị na-ebi ndụ aghụghọ ga-ajọ njọ karịa ka ha dị. Ha ga-eduhie ndị ọzọ, ma bụrụkwa ndị a ga-eduhie.


Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ omume niile na ekweghị ekwe niile nke obi ghara ịdị nʼime onye ọbụla nʼetiti unu, nke ga-eme ka unu site nʼiso Chineke dị ndụ tụgharịa.


Ma mgbe ọbụla onye ikpe a nwụrụ, ụmụ Izrel na-alaghachi azụ biwe ndụ ọjọọ karịa nke nna nna ha ochie. Ha na-agbaso chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala nye ha, na ife ha ofufe. Ha jụrụ iwezuga agwa ọjọọ ha ndị a ma ọ bụkwa ụzụ isiike ha.


Nʼihi na nnupu isi dịka mmehie ịgba afa, mpako dịkwa njọ dịka ikpere arụsị. Nʼihi na ị jụla okwu Onyenwe anyị ya onwe ya ajụkwala gị dịka eze.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan