Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 15:8 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Aga m eme ka ọnụọgụgụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ baa ụba. Ha ga-ehi nne karịa aja dị nʼọnụ oke osimiri. Nʼetiti ehihie ka m ga-eme ka onye mbibi bịakwasị ndị bụ nne ụmụ okorobịa ha; na mberede ka m ga-eme ka nhụju anya na ihe oke egwu bịakwasị ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

8 Ndinyom-ha di-ha nwuru ababigaworom uba ókè kari ájá nke oké osimiri nile: emewom ka onye nke nāpunara madu ihe biakute ha n'etiti-ehihie imegide nne nke umu-okorọbia: emewom ka nhuju-anya na obi-ọlulọ-miri dakwasi ya na mberede.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 15:8
15 Iomraidhean Croise  

Ndị ikom unu ka a ga-eji mma agha gbuo, ndị bụ dike ka a ga-egbu nʼagha.


Ọnụ ụzọ ama niile nke Zayọn ga-eti mkpu akwa ruokwa ụjụ. Ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-anọdụ nʼala.


Nʼoge ahụ, ndị ikom ole na ole ga-afọdụ ndụ. Nke a ga-eme ka ndị inyom asaa na-azọ otu nwoke. Ha ga-abịakwute ya sị ya “Kwere ka anyị niile bụrụ ndị nwunye gị! Anyị ga-akpara onwe anyị nri, zụọra onwe anyị akwa. Naanị kwere ka anyị na-aza aha gị, ka a ghara ịkọ anyị ọnụ.”


Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụmụ ndị ikom niile na ụmụ ndị inyom niile a mụrụ nʼala a. Otu a ka ọ kwukwara banyere nne na nna ụmụntakịrị ndị a.


Ya mere, were ụmụ ha nyefee nʼaka ụnwụ. Werekwa ha onwe ha nyefee nʼaka mma agha. Mee ka ndị nwunye ha ghọọ ndị gba aka ụmụ na di. Meekwa ka e gbuo ndị ikom ha, ka mma agha gbukwaa ụmụ okorobịa nʼọgbọ agha.


Aga m ezite ndị mbibi ndị ga-abịa megide gị. Onye ọbụla nʼime ha ga-eji ngwa agha ya. Ha ga-egbutusịkwa osisi sida ọma gị niile, tụnye ha niile nʼime ọkụ.


“Gwa mba niile otu a, ha abịala, kpọsaa banyere Jerusalem: ‘Ndị agha ga-agba gị gburugburu na-abịa site nʼala dị anya, na-eti mkpu agha megide obodo niile nke Juda.


Ya mere, aga m eme ka ọdụm si nʼoke ọhịa bịa lụso ha ọgụ; nkịta ọhịa bi nʼọzara ga-ebibi ha. Otu a kwa, agụ ga-abịa makpuru nso nso obodo ha ịdọkasị onye ọbụla si nʼime obodo ahụ na-apụta. Ihe ndị a ga-emezu nʼihi na nnupu isi ha adịla ukwuu, na nʼihi na ndaghachi azụ ha site na iso ụzọ m adịla ukwuu.


Unu ndị m, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe. Tụrụọnụ onwe unu na ntụ, ruonụ uju, ma kwaanụ akwa, dịka nwanyị na-eru ụjụ nʼihi ọnwụ otu nwa nwoke ọ mụtara. Nʼihi na onye mbibi ahụ ga-abịakwasị anyị na mberede.


Anyị aghọọla ụmụ mgbei, na ndị na-enweghị nna. Nne anyị ha dị ka ndị inyom di ha nwụrụ.


E nwere izuzu ọjọọ nke ndị ụmụ eze nọ nʼime ya, dịka ọdụm nke na-agbọ ụja na-adọgbu anụ ọ na-eri eri, ha na-eripịa ndị mmadụ. Ha ewerela akụ ha na ihe ha niile dị oke ọnụahịa, mekwa ka ụmụ nwanyị na-enweghị di baa ụba nʼetiti ya.


Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị, ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ. Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi


Nʼihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi nʼelu ụwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan