Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 15:7 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Aga m eji ihe e ji afụcha ọka fụchaa ha nʼọnụ ụzọ ama nke ala ahụ. Aga m eme ka mbibi bịakwasị ndị m, nke ga-eme ka ha gbara aka ụmụ, nʼihi na ha esitebeghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

7 M'we were ihe-nfucha fucha ha n'ọnu-uzọ-ama nke ala nka; ab͕abawom ha aka umu, emewom ka ndim la n'iyì; ha esighi n'uzọ nile ha lata.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 15:7
21 Iomraidhean Croise  

Ma ndị ajọ omume adịghị otu a. Ha dị ka igbugbo ọka nke oke ifufe na-efesasị.


Unu ga-ayọgharị, fụchaa ha; ikuku ga-eburu ha bufuo, oke ikuku ga-ekposasị ha. Ma unu ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nyaakwa isi nʼime Onye dị nsọ nke Izrel.


Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụ ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.


Ma ọ bụ ezie na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a, ndị Izrel echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya.


Ya mere, were ụmụ ha nyefee nʼaka ụnwụ. Werekwa ha onwe ha nyefee nʼaka mma agha. Mee ka ndị nwunye ha ghọọ ndị gba aka ụmụ na di. Meekwa ka e gbuo ndị ikom ha, ka mma agha gbukwaa ụmụ okorobịa nʼọgbọ agha.


Onyenwe anyị, anya gị abụọ ọ bụghị eziokwu ka ọ na-achọ? Ị tiela ha ihe, ma o metụghị ha nʼahụ. I gwepịara ha, ma ha ekweghị a nabata ịdọ aka na ntị. Ha emeela ka ihu ha sie ike karịa nkume, ha ajụla ịchịgharị.


Aga m eziga ndị mba ọzọ nʼobodo Babilọn, ka ha gaa fụchaa ya, bibiekwa ala ya. Ha ga-emegide ya nʼakụkụ niile, nʼụbọchị ahụ ihe ọjọọ ga-abịakwasị ya.


Nʼihi na ọnwụ abatala nʼetiti anyị, o si na oghereikuku niile nke ụlọ anyị bata nʼebe niile e wusiri ike nke ala anyị. O gbuola ụmụntakịrị ndị na-ejegharị nʼokporoụzọ, gbukwaa ụmụ okorobịa ndị na-anọ nʼama.


Gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga ime ka ebe nsọ m ghara ị dị nsọ, bụ ebe e wusiri ike nke unu ji na-anya isi, ihe na-amasị anya unu, nke ihe banyere ya na-atọ obi unu ụtọ. Ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom, ndị unu hapụrụ ga-ada site na mma agha.


“Ma gị, nwa nke mmadụ, nʼụbọchị ahụ m napụrụ ha ebe ha siri ike, nke bụ ọṅụ ha na ebube ha, na ihe anya ha na-achọsi ike; na ihe na-atọ obi ha ụtọ, na ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom,


Aga m eme ka ndị m, ndị m bụ Izrel, biri nʼime unu. Unu ga-abụ ihe nweta ha, unu ga-aghọkwara ha ihe nketa. Unu agakwaghị agbaba ha aka ụmụ ọzọ.


Unu adịla ka ndị nna unu ha, ndị amụma mbụ kpọrọ oku si, Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara: ‘Sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ajọ omume unu chigharịa’ ma ha achọghị ịnụ maọbụ gee m ntị, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.


Ihe ịfụcha ọka ya dị ya nʼaka, ọ ga-azacha ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, chịkọta mkpụrụ ọka wiiti tinye ha nʼọba, ma jiri ọkụ a na-apụghị imenyụ emenyụ rechapụ igbugbo ọka.”


Ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ, ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke ala gị ga-abụ, ya na ụmụ nke igwe anụ ụlọ gị, na ụmụ ehi gị na nke igwe ewu na atụrụ gị mụrụ.


A ga-ewere ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom nye ndị mba ọzọ. Ọ ga-agụ gị agụụ ogologo oge ka ị hụ ha anya, ma ị pụghị inyere ha aka.


Ị ga-amụta ụmụ ndị ikom na ndị inyom ma ha agaghị adịgide nʼihi na a ga-adọta ha nʼagha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan