Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 15:2 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ọ bụrụ na ha ajụọ gị si, ‘Ebee ka anyị ga-aga?’ Gwa ha na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Ndị e debere nʼihi ọnwụ ga-anwụ, ndị e debere nʼihi mma agha ka mma agha ga-egbu; ndị e debere nʼihi ụnwụ ka ụnwụ ga-egbu, otu a kwa, ndị e debere nʼihi ịdọta nʼagha, ka a ga-adọta nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

2 O gēru kwa, mb͕e ha gāsi gi, Òle ebe ayi gāpu? i gāsi kwa ha, Otú a ka Jehova siri: Ndi diri ọnwu gāpukuru ọnwu; ndi diri mma-agha gāpukuru mma-agha; ndi diri oké unwu gāpukuru oké unwu; ndi diri ndọta-n'agha gāpukuru ndọta-n'agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 15:2
18 Iomraidhean Croise  

Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ, maọbụ dọkpụrụ unu dịka ndị mkpọrọ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.


Onye ọbụla nʼime unu nke gbara ọsọ nʼihi ihe egwu ga-adaba nʼolulu; onye ọbụla sitekwara nʼolulu rịpụta ga-azọnye ụkwụ ya nʼọnya. Nʼihi na mmiri nke ịla nʼiyi esitela na mbara eluigwe na-ezokwasị unu. Ntọala ụwa na-amakwa jijiji.


Ọ bụ ezie na ha na-ebu ọnụ, agaghị m ege ntị nʼakwa ha; ọ bụrụkwa na ha achụọrọ m aja nsure ọkụ, maọbụ aja mkpụrụ onyinye, agaghị m anabata ha. Kama, aga m eji mma agha na ụnwụ, na ọrịa dị iche iche bibie ha.”


A ga-esitekwa nʼụlọ tụpụ ndị ahụ niile ha na-eburu amụma nʼokporoụzọ Jerusalem nʼihi ụnwụ na mma agha. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ndị nwunye ha, maọbụ ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Nʼihi na aga m awụkwasị ha ihe ọjọọ ahụ niile ruuru ha.


“Ha ga-anwụ site nʼajọ ọrịa nke ga-egbu ha niile. O nweghị onye ga-eru ụjụ nʼihi ha, a gaghị elikwa ha. Kama ha ga-adị ka unyi e kposara nʼala. Mma agha na ụnwụ ga-ala ha nʼiyi, ozu ha ga-abụkwa ihe oriri nye ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa nke ụwa.”


“ ‘Nʼebe a ka m ga-anọ laa nzube niile nke Juda na Jerusalem nʼiyi. Aga m eme ka ha daa site na mma agha nʼihu ndị iro ha, nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike. Aga m enye ụmụ anụ ufe na anụ ọhịa ozu ha dịka nri.


Ọ ga-abịa buso Ijipt agha, si otu a mee ka ha nwụọ, bụ ndị ahụ a kwadobere maka ọnwụ, mee ka a dọta ha nʼagha, bụ ndị ahụ a kwadobere na-aga adọta nʼagha; mekwaa ka ha nwụọ site na mma agha bụ ndị ahụ a kwadobere na ha ga-anwụ site na mma agha.


Sị ha, ‘Mụ onwe m bụ ihe ama nye unu.’ “Dịka m mere, otu a kwa ka a ga-eme nye ha. Ha ga-aga na mba ọzọ biri ka ndị a dọtara nʼagha.


“Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, a ga-esi aṅaa napụta ya, mgbe m zipụrụ ụzọ ikpe m anọ dị oke egwu nke na-echere Jerusalem. Ikpe ndị a bụ: mma agha na ụnwụ, anụ ọhịa ọjọọ na-adọgbu adọgbu na ọrịa na-efe efe, ka ha gbuchapụ mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime ya.


“Gwa ha nke a, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, dịka m na-adị ndụ, ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ e tikpọrọ etikpọ ga-anwụcha site na mma agha. Ndị bi nʼọhịa ka anụ ọhịa ga-atagbu. Ndị niile bi nʼọgba na nʼebe niile e wusiri ike ga-anwụ site nʼọrịa.


Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ndị bi nʼime gị ga-anwụ site nʼagụụ maọbụ na ọrịa; otu ụzọ ga-anwụ site na mma agha nke ndị iro nọ nʼazụ mgbidi gị, otu ụzọ fọdụrụ ka a ga-achụsa nʼifufe, a ga-eji mma agha ndị iro chụsasịa ha.


Ị ga-ewere otu ụzọ nʼụzọ atọ, kpọọ ya ọkụ nʼetiti obodo ahụ mgbe ụbọchị nke nnọchigide ahụ zuru; ị ga-ewere otu ụzọ, jiri mma agha chabichaa ya gburugburu obodo ahụ, otu ụzọ nke ọzọ ka ị ga-efesacha nʼikuku. Nʼihi na aga m eji mma agha chụsachaa ha.


O meela ka okwu ya guzosie ike, bụ nke o kwuru megide anyị na ndị ndu anyị site nʼiwetara anyị oke mbibi a. Nke bụ na o nwebeghị mgbe ọbụla e merela ụdị ihe emere na Jerusalem nʼokpuru eluigwe.


Ọ ga-adị ka onye si nʼihu ọdụm na-agbapụ ma zute anụ ọhịa bịa, maọbụ onye gbabara nʼụlọ ya izuike ma tụkwasị aka ya nʼaja ụlọ, agwọ ataa ya.


Nʼihi ya, ekwuru m si, “Agaghị m abụkwa onye ọzụzụ atụrụ unu ọzọ. Nke ọbụla na-anwụ, ya nwụọ, ọzọ, nke na-ala nʼiyi, ya laa nʼiyi. Ka ndị fọdụrụ rie anụ ahụ ibe ha.”


“Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla a ga-adọta nʼagha, ọ bụ ha ka a ga-adọtakwa nʼagha. Ọ bụrụ na ọ dị onye ọbụla ga-anwụ site na mma agha, aghaghị iji mma agha gbuo ha.” Ka nke a bụrụ ihe ịgbaume na iguzosikwa ike nʼokwukwe nke ndị Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan