Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 14:3 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ndị a na-asọpụrụ na-ezipụ ndị ohu ha ịga chọta mmiri. Ha na-aga nʼolulu mmiri ma o nweghị mmiri ha na-achọta. Ha bu ite nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya na-alọta. Ha ji aka ha kpuchie isi ha nʼihi ịda mba nke obi na nʼihi ọnọdụ obi ọjọọ nke ha nọ nʼime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

3 Ndi-ebube-ha ezigawo ndi-ntà-ha ichuta miri: ha abiaruwo olùlù-miri nile, ha achọtaghi miri; ha alatawo n'ite efu: ihere emewo ha, etiyewokwa ha n'ọnọdu-ihere, ha ekpuchiwo kwa isi-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 14:3
23 Iomraidhean Croise  

Ma Devid na ndị so ya chere ihu irigo Ugwu Oliv. Mgbe ọ na-aga, Devid nọ na-akwa akwa. O yikwaghị ihe ọbụla nʼụkwụ ya, ma o ji ihe kpuchie isi ya. Ndị niile so ya kpuchikwara isi ha na-akwakwa akwa ka ha na-arịgo.


Eze kpuchiri ihu ya nọgidekwa na-akwa akwa na-asị, “O, nwa m Absalọm! O! Absalọm nwa m, nwa m!”


Ma mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị, mmiri ahụ tara, nʼihi na mmiri adịghị ezokwa nʼala ahụ.


“Unu aṅakwala Hezekaya ntị. Ihe a ka eze Asịrịa kwuru: Pụkwutenụ m, bịanụ ka mụ na unu mee udo. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼime unu ga-eri mkpụrụ si nʼubi vaịnị ya na nke si nʼosisi fiig ya, ṅụọkwa mmiri nke si nʼihe icheta mmiri ya:


Emesịa, Mọdekai lọghachiri nʼọnụ ụzọ ama eze. Ma Heman mere ngwangwa laa nʼụlọ ya, kpuchiekwa isi ya nʼiru ụjụ,


Obi mgbu na-ejide ha nʼihi na ha nwere ntụkwasị obi, ha bịarutere ebe ahụ, bụrụ ndị emenyere ihere.


A ga-eji ihere yikwasị ndị na-ebo m ebubo dịka uwe werekwa ihere kee ha gburugburu dịka uwe mwụda.


Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara; ka ndị niile ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m, laghachi azụ nʼihere.


Ala na-agbawa nʼihi enweghị mmiri ozuzo. Ndị ọrụ ubi na-ekpuchikwa isi ha nʼihi obi ọjọọ ha.


Gịnị mere ihe mgbu m adịghị akwụsị akwụsị? Gịnị mekwara ọnya m ji dị njọ na-apụghị ịgwọta ya? Ị dịrị m dịka mmiri iyi na-arafu mmadụ, dịka isi iyi nke na-ekwesighị ntụkwasị obi.


“Nʼihi na ndị m emeela ihe ọjọọ abụọ. Ha agbakụtala m azụ, bụ Isi iyi mmiri ndụ, gwuoro onwe ha ebe ichebe mmiri nke tipuru etipu na-enweghị ike ịnagide mmiri ọbụla.


Unu ga-ebu aka unu nʼisi mgbe unu si ebe ahụ na-apụ, nʼihi na Onyenwe anyị ajụla ndị ahụ unu tụkwasịrị obi. Ha agaghị enyere unu aka.


Ma Onyenwe anyị nọnyeere m dịka dike nʼagha; nʼihi ya, ndị na-esogbu m ga-asọ ngọngọ, ha agaghị emerikwa m. Ihe ha zubere agaghị emezuru ha, nʼihi ya, ihere ga-eme ha nke ukwuu; a gaghị echezọkwa ọnọdụ ihere ha ruo ebighị ebi.


Ọ bụ nke a mere mmiri ji kwụsị izokwara unu, ọbụla dị mmiri nke na-ezo nʼoge ọkọchị. Nʼihi na unu bụ ndị akwụna, ndị ihere na-adịghị eme.


Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ ya nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ. Ụmụntakịrị na-arịọkwa ka e nye ha nri, ma o nweghị onye na-enye ha nri ahụ.


Ma ọ bụghị otu a, aga m eyipụ ya uwe ya mee ka ọ gbara ọtọ, aga m eme ka o gbara ọtọ dị ka nʼụbọchị ahụ a mụrụ ya. Aga m eme ya ka ọ dị ka ọzara, ka ọ ghọọ nʼala kpọrọ nkụ, were akpịrị ịkpọ nkụ mee ka ọ nwụọ.


Ọ bụladị ụmụ anụ ọhịa na-ebeku gị akwa, nʼihi na iyi niile ataala, ọkụ erechapụkwala ebe ịta nri nke anụmanụ niile nke dị nʼọzara.


“Ọzọkwa, Mụ onwe m gbochikwara mmiri izoro unu, mgbe ọ fọdụrụ ọnwa atọ tupu owuwe ihe ubi ebido. Enyere m otu obodo mmiri ozuzo, ma gbochie ya izoro obodo nke ọzọ. Mmiri zoro nʼotu ubi, ma nke mmiri ezoghị na ya kpọnwụrụ.


Ndị si obodo abụọ maọbụ atọ chọrọ mmiri ọṅụṅụ jee nʼobodo ọzọ, ma ha enwetaghị nke ha ji aṅụju afọ, ma nʼime ihe ndị a niile unu alọghachikwuteghị m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.


Ọ bụrụ na ndị ọbụla si na mba dị iche iche esoghị jee Jerusalem ife Eze ahụ, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ha agaghị enwetakwa mmiri ozuzo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan