Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 13:21 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Gịnị ka ị ga-asị mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị ahụ ị gụrụ dịka ndị enyi gị bịa buso gị agha? Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gị ọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

21 Gini ka i gāsi, mb͕e Ọ gēwere nmehie-gi leta gi, ebe gi onwe-gi zíworo ndi ahu imegide gi, bú ezi ndi-eyì-gi, ka ha buru ndi-isi-gi? ihe-nb͕u di iche iche, hà agaghi-ejidesi gi ike, dika nwanyi ime nēme?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 13:21
17 Iomraidhean Croise  

Ehaz zigara ndị ozi ka ha gaa zie Tiglat-Pilesa, eze ndị Asịrịa ozi, sị ya, “Abụ m ohu gị, onyenwe m ka ị bụ. Bịa napụta m site nʼaka eze ndị Aram na eze ndị Izrel, ndị na-ebuso m agha.”


Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu? Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu? Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka? Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile?


Ha ga-ama jijiji nʼihi oke egwu. Ahụ mgbu ga-abịakwasị ha mee ka ha sụọ ude dịka nwanyị ime na-eme. Ha ga-elerịta onwe ha anya nʼọnọdụ mgbagwoju anya, ha agaghị amakwa ihe ha ga-eme. Ọnọdụ dị otu a ga-apụta ihe nʼihu ha.


Nʼihi nke a, ahụ m niile nọ nʼoke ihe mgbu, oke ihe mgbu zuru m ahụ, dịka ihe mgbu nke nwanyị ime na-eme. Amara m jijiji nʼihi ihe m nụrụ, ihe m na-ahụ na-agbagwoju m anya.


Agbala ọsọ ruo mgbe ị ga-agbara ụkwụ efu, mgbe akpịrị ga-akpọ gị nku. Ma ị na-asị, ‘O nweghị uru ọ bara. Nʼihi na ahụrụ m chi ndị mba ọzọ nʼanya, aghaghị m ịgbaso ha.’


Gị onye na-ebi na Lebanọn, onye ebe obibi ya dị nʼụlọ e ji osisi sida wuo, lee ka i si na-asụ ude mgbe ihe mgbu bịakwasịrị gị, ihe mgbu yiri nke nwanyị ime na-eme.


Jụọnụ ajụjụ, ma hụ, nwoke ọ pụrụ ịmụ ụmụ? Gịnịkwa mere m ji na-ahụ ndị ikom dị ike ka ha tụkwasịrị aka ha nʼukwu ha dịka nwanyị ime na-eme, ihu onye ọbụla gbanwekwara dịka nke onye na-anwụ anwụ?


A ga-akpụta ndị inyom niile fọdụrụ nʼụlọeze Juda mee ka ha pukwuru ndịisi eze Babilọn. Ndị inyom ndị a ga-asị gị, “ ‘Ndị enyi gị ahụ niile ị na-atụkwasị obi arafuola gị, mee ka ị bụrụ onye e meriri emeri. Ụkwụ gị abụọ emikpuola nʼime apịtị, ugbu a, ndị enyi gị niile ahụ agbanarịla gị.’


Gịnị bụ nke a, gị onye na-enweghị olileanya? Gịnị mere unu ji yiri uwe uhie, were ọlaolu ọlaedo dị oke ọnụ yiri nʼolu? Gịnị mere unu ji were ihe ịchọ mma tee nʼanya unu? Nʼefu ka unu na-eme onwe unu ka unu dị mma. Ndị iko unu na-elelị unu; ndụ unu ka ha na-achọkwa.


Ana m anụ olu iti mkpu akwa nke yiri olu akwa nwanyị ime na-eme, ọ dị ka ude nwanyị na-agbalị ịmụpụta nwa mbụ ya. Ma olu akwa m nụrụ bụ nke ada Zayọn, ebe ọ nọ na-eku ume ike ike. Ọ dara nʼala gbasapụ aka ya, ma na-akwa akwa na-asị, “Onye nwụrụ anwụ ka m bụ! Lee, ndụ m ka e nyere ndị ogbu mmadụ.”


A ga-adọta Keriọt nʼagha, meriekwa ebe ya niile e wusiri ike. Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bụ dike nʼagha nʼala Moab ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme.


Lee, ndị amụma na-ebu naanị amụma ụgha, ndị nchụaja na-achịkwa ndị m site nʼọchịchị nke nʼaka ike, ma lee, ndị m hụrụ ndụ dị otu a nʼanya. Gịnịkwa ka unu ga-eme nʼoge ikpeazụ.”


Anyị anụla akụkọ banyere ude ha, ike agwụla aka anyị abụọ kpamkpam. Oke ihe mgbu na-ejide anyị dị ka nke nwanyị ime na-eme.


Mgbe nke a mere, ị ga-asị, “Mụ onwe m bụ chi,” nʼihu ndị ahụ na-egbu gị? Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi, nʼaka ndị ahụ na-egbu gị.


Ma ihe ndị a niile bụ naanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa.


Mgbe ha ga na-asị udo, na nchekwa dị, mgbe ahụ, na mberede, mbibi ga-abịakwasị ha dị ka ihe mgbu sị adakwasị nwanyị ime na-eme, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara inwe ike ịgbapụ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan