Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 13:18 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Gwanụ eze na nne eze okwu sị ha, “Sitenụ nʼocheeze unu rịdata, nʼihi na okpueze ọma unu ga-esi nʼisi unu dapụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

18 Si eze, si kwa eze-nwayi, Menu onwe-unu ka unu di ala, nọdunu ala: n'ihi na ihe-isi nile nke unu adapuwo, bú okpu-eze nke ima-nma-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 13:18
30 Iomraidhean Croise  

Jehoiakin, bụ eze Juda, na nne ya na ndị ọrụ ya niile na ndịisi niile na ndịisi ozi ya niile were onwe ha nyefee Nebukadneza nʼaka. Nʼafọ asatọ nke ọchịchị eze Babilọn ka ọ kpụụrụ Jehoiakin dịka onye mkpọrọ.


Nebukadneza kpụụrụ Jehoiakin ka ọ ga biri na Babilọn. O sikwa na Jerusalem kpọrọ nne eze, na ndị nwunye eze, ndị ozi ya, na ndị niile a ma ama nʼala ahụ gaa Babilọn.


Nʼoge ahụ ka anya doro Manase. O wedara onwe ya ala nke ukwuu, rịọọ amara site nʼaka Onyenwe anyị Chineke nna nna ya.


Ekpere ya, na ọsịsa Chineke zara ya, na mmehie ya niile, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya, na ebe niile o wuru ụlọ arụsị nʼelu ugwu, na ebe ọ manyere ogidi arụsị Ashera, na arụsị ndị ọzọ, tupu o weda onwe ya ala, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị amụma.


Ma o wedaghị onwe ya ala nʼihu Onyenwe anyị dịka Manase nna ya mere. Kama Amọn gara nʼihu mee ka ikpe ọmụma ya mụbaa.


Ọzọ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero gwa ya sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, ‘Ọ bụ ruo olee mgbe ka ị ga-ajụ iwedata onwe gị ala nʼihu m? Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.


jirikwa ezi akwa ọcha mee akwa ike nʼisi, okpu akwa ọcha, na uwe ukwu nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma.


nʼihi na akụnụba adịghị adịgide. Ọ bụladị okpueze nke onye eze na-emesịa gabiga.


ma akwa ha na-eyi nʼisi, na ọla ụkwụ, ma ihe ha na-eke nʼukwu, ma karama mmanụ isi ụtọ, ma ọgwụ dị iche iche;


Ọnụ ụzọ ama niile nke Zayọn ga-eti mkpu akwa ruokwa ụjụ. Ọ ga-atọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-anọdụ nʼala.


“Rịda nʼala, nọdụ na uzuzu, gị nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Babilọn, nọdụ nʼala na-ejighị ocheeze, gị eze nwanyị obodo ndị Babilọn. Agaghị akpọkwa gị onye dị nro, maọbụ onye dị pekepeke.


“Ma dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “a sịkwarị na gị, bụ Jehoiakin, nwa Jehoiakim eze Juda, bụ mgbaaka akara m gbanyere na mkpịsịaka dị nʼaka nri m, aga m agbapụkwa gị,


Aga m atụfu gị na nne mụrụ gị, tụga unu na mba ọzọ dị iche site nʼobodo a nọ mụọ unu. Ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ.


Nke a bụ mgbe eze Jehoiakin, nne eze, ndị ozi nʼụlọeze, ndị ndu Juda na Jerusalem, ndị ọka, na ndị ụzụ sitere na Jerusalem dọta ha nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.


Mgbe ha nụchasịrị okwu dị nʼakwụkwọ ahụ, ha lerịtara onwe ha anya nʼegwu, gwa Baruk okwu sị ya, “Anyị aghaghị ime ka okwu ndị a ruo eze ntị.”


Ịma mma niile esitela nʼahụ ada Zayọn pụọ. Ụmụ eze ya dị ka ele nke na-enweghị ike ịchọta ebe ịta nri. Nʼihi adịghị ike ha, ha esitela nʼihu ndị na-achụ ha ọsọ gbalaga.


Ịrụ arụ ya pụtara ihe, ọ bụladị nʼuwe ya. Ọ dịkwaghị mgbe o chere echiche banyere ihe dị na-eche ya nʼoge dị nʼihu. Lee ka o si daa, dasie ike, ma ọ dịghị onye bịara kasịe ya obi. “Onyenwe anyị, lee nsogbu m niile. Lee ka ndị iro si merie m.”


Ndị okenye ada Zayọn nọ ọdụ nʼala, dere duu. Ha ekpokwasịla aja nʼisi ha; ha eyikwasịkwala onwe ha uwe mkpe. Ụmụ agbọghọ Jerusalem na-amaghị nwoke ehulatala isi ha nʼala.


Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na anyị emehiela.


Etinyekwara m gị ọla nʼimi, tinye gị ọlantị abụọ na ntị gị, na okpueze mara mma nʼisi gị.


ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, yipụ okpueze gị, ya na akwa ị na-atụghị nʼisi. Ihe agaghị adịkwa dịka o si adị na mbụ. A ga-ebuli ndị dị ala, wedata ndị dị elu.


I nwere ike sụọ ude, ma asụsila ya ike. Ị gaghị eru uju nʼihi onye nwụrụ anwụ. Kechie isi gị, yirikwa akpụkpọụkwụ gị, ekpuchila egbugbere ọnụ gị, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ na-eri.”


Ihe ikechi isi unu ga-adịgide nʼisi unu, akpụkpọụkwụ unu ga-adịkwa nʼụkwụ unu. Unu agaghị akwa akwa maọbụ tie aka nʼobi, kama unu ga-ata ahụ nʼihi mmehie unu, sụkwaa ude nʼetiti onwe unu.


Ha ga-eji akwa ọcha kee nʼisi ha, yirikwa uwe ọcha nʼukwu ha. Ha agaghị eyi ihe ọbụla ga-eme ka ọsịsọọ gbaa ha.


Ma mgbe nganga na ịnya isi jupụtara ya obi, Chineke sitere nʼocheeze ya wezuga ya, napụkwa ya ebube o nwere dịka eze.


Mgbe akụkọ a rutere eze Ninive ntị, o sitere nʼocheeze ya rituo, wezuga uwe eze ya, yikwasị uwe mkpe, nọkwasịkwa na ntụ.


Onye ọbụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị a bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nʼalaeze eluigwe.


Wedanụ onwe unu ala nʼihu Onyenwe anyị ọ ga-ebulikwa unu elu.


Ya mere, wedanụ onwe unu nʼokpuru aka dị ike nke Chineke, ka o bulie unu elu nʼoge ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan