Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 12:4 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ruo ole mgbe ka ala ga-eru ụjụ? Ruo ole mgbe ka ahịhịa dị nʼubi ga-anọgide na-akpọnwụ? Ụmụ anụmanụ na nnụnụ na-anwụchasị nʼihi na ndị bi nʼala ahụ bụ ndị na-emebi iwu. Ma ndị mmadụ ahụ na-ekwu sị, “Ọ gaghị ahụ ihe ga-adakwasị anyị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

4 Rùe ole mb͕e ka ala gēru újú? rùe ole mb͕e ka ihe-ọkukú nke ubi nile gākpọnwu? site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya ekpochapuwo anu-ulo nile na anu-ufe; n'ihi na ha siri, Ọ gaghi-ahu ikpe-azu-ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 12:4
22 Iomraidhean Croise  

Ọ na-eme ka ala na-amị mkpụrụ hiri nne ghọọ ọzara, nʼihi ajọ omume nke ndị bi nʼime ya.


Ihe ndị a ka unu mere ma agbachiri m nkịtị; unu chekwara na adị m ka unu. Ma aga m abara unu mba ma bokwaa unu ebubo unu nʼihu unu.


Ala atakọchaala, ma kpọnwụọ. Ụwa ahụjuola anya ma kpọnwụọ. Eluigwe na nʼụwa so na-ahụjukwa anya.


Ya mere, ọbụbụ ọnụ na-eripịa ụwa; ndị bi nʼime ya aghaghị ịnatakwa ikpe ọmụma ha. Ya mere ndị niile bi nʼụwa na-ere ọkụ, ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole fọdụrụ.


Ha emeela ya ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu; e, ọ ghọọla ebe kpọrọ nkụ nʼebe tọgbọrọ nʼefu nʼihu m. Ala ahụ niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu, nʼihi na o nweghị onye ọbụla ihe banyere ya na-emetụ nʼobi.


“Juda na-eru ụjụ, ndị bi nʼobodo ya niile na-ahụjukwa anya. Ha na-akwa akwa nʼihi ala ahụ, ụda ịkwa akwa ha eruokwala Jerusalem.


Ndị jupụtara nʼala a bụ ndị na-akwa iko. Nʼihi ịbụ ọnụ ndị a niile ala a tọgbọrọ nʼefu, ahịhịa niile dị nʼọzara akpọnwụọla. Ndị amụma na-agbasokwa ihe ọjọọ. Ha na-egosikwa ike ha nʼụzọ na-ezighị ezi.


Elere m anya ma ahụghị mmadụ ọbụla, ụmụ nnụnụ niile dị na mbara eluigwe efefusịala.


Ụwa ga-eru ụjụ, mbara eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị. Nʼihi na ekwuola ya, agaghị m agbanwe obi m. Ekpebiela m ya, agaghị m alakwa azụ nʼihe m zubere ime.”


Ndị amụma ndị a niile dịka ikuku, nke okwu nwere isi na-adịghị nʼime ha. Ya mere, ka ihe ahụ niile ha buru nʼamụma bịakwasị ha.”


Lee, ndị amụma na-ebu naanị amụma ụgha, ndị nchụaja na-achịkwa ndị m site nʼọchịchị nke nʼaka ike, ma lee, ndị m hụrụ ndụ dị otu a nʼanya. Gịnịkwa ka unu ga-eme nʼoge ikpeazụ.”


“ ‘Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Iwe m na ọnụma m ka a ga-awụkwasị nʼebe a, nʼelu ndị mmadụ, na anụmanụ, na osisi dị nʼọhịa, na mkpụrụ nke ala ubi. Ọ ga-ere ọkụ ma agaghị emenyụ ya.


Aga m anọ nʼelu ugwu ukwu kwa akwa. Nʼebe ahụ ka m ga-anọ kwaa ụwa m nʼihi ebe ịta nri nke anụmanụ ndị ahụ dị nʼọzara. Ha tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịghị onye na-ejegharị nʼime ya. A naghị anụkwa olu anụ ụlọ nʼebe ahụ. Ụmụ nnụnụ efefusịala. Otu a kwa, ụmụ anụmanụ alaala.


Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara sị, “M ga-aghara ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ megide mba dị otu a?”


Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ, ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ, ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe, ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ.


Lee otu anụ ụlọ niile si eze ume! Igwe ehi na-awagharị nʼihi na ha enweghị ebe ịta nri; ọ bụladị igwe atụrụ nọkwa nʼọnọdụ ịta ahụhụ.


Ọ sịrị, Onyenwe anyị si nʼugwu Zayọn na-ebigbọ, o si na Jerusalem na-eme ka olu ya daa ụda. Ebe ịta nri nke ndị ọzụzụ atụrụ ga-eru ụjụ. Elu ugwu Kamel ga-akpọnwụkwa.


A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru, na ọ dịghị mkpụrụ dị nʼosisi vaịnị, a sịkwa na mkpụrụ osisi oliv ebilata na ala ubi niile emepụtaghị ihe oriri, a sịkwa na ọ dịghị atụrụ dị nʼọgba anụ, na ọ dịkwaghị ehi nọ nʼụlọ anụmanụ,


Mgbe ahụ, mmụọ ozi nke Onyenwe anyị sịrị, “Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide hapụ imere Jerusalem na obodo niile nke Juda ebere, bụ obodo ị na-eweso iwe iri afọ asaa ndị a gara aga?”


Anyị maara na ruo ugbu a, ihe niile e kere eke na-asụ ude nʼihi ihe mgbu ha nọ nʼime ya, dịka ihe mgbu nke ọmụmụ nwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan