Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 12:2 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ị kụọla ha ka osisi, ha agbaala mgbọrọgwụ; ha na-etokwa na-amị mkpụrụ. Ị nọ nso mgbe niile nʼọnụ ha, ma ị nọ nʼebe dị anya nʼobi ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

2 I kuwo ha dika osisi, e, ha ab͕awo nkpọrọgwu; ha nētó, e, ha amiwo nkpuru: nso ka I nọ n'ọnu-ha, ma I nọ akuru-ha n'ebe di anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 12:2
15 Iomraidhean Croise  

Ụzụ ịsụ ude ndị na-anwụ si nʼobodo na-ebili, mkpụrụobi nke ndị e merụrụ ahụ na-eti mkpu enyemaka. Ma ọ dịghị onye Chineke na-ahụta ka onye ikpe mara nʼihi ihe ndị a.


Mụ onwe m ahụla onye nzuzu ka ọ na-agba mgbọrọgwụ, mana mberede, abụrụ ụlọ ya ọnụ.


Ahụla m onye ajọ omume na nwoke na-eme ihe ike, ka ọ na-eto, na-awasa, dịka osisi dị ndụ nʼezi ala,


Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a ji ọnụ ha na-abịa m nso, ha ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. Ofufe ha na-efe m, bụ nke gbadoro ụkwụ nʼihe mmadụ nyere nʼiwu, bụkwa nke a kuziiri ha.


Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye ahụ kụnyere gị nʼala, e nyela iwu na mbibi ga-abịakwasị gị, nʼihi na ndị Izrel na Juda emeela ihe ọjọọ, kpasuo m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal.


Nʼagbanyeghị nke a, nwanne ya nwanyị nke na-ekwesighị ntụkwasị obi, bụ Juda ejighị obi ya lọghachikwute m, maọbụ naanị nlọghachi aghụghọ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.


Ma ihe ndị a ka ị ga-agwa ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Aga m akwada ihe ndị ahụ niile m wuru, hopukwa ihe ndị ahụ niile m kụrụ nʼala a niile.


Ha na-abịakwute gị dịka ndị mmadụ si abịa, ha na-anọrọ ala nʼihu gị na-anụ ihe ị na-ekwu ma ha anaghị emepụta ya nʼomume: nʼihi na ha na-eji egbugbere ọnụ ha na-egosi ịhụnanya, ma obi ha nọ naanị na uru ọjọọ ha ga-enweta.


Ha ejighịkwa obi ha akpọku m, kama ha na-atụrụ onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-eti mkpu akwa. Mgbe ha na-arịọ arịrịọ maka mkpụrụ ubi na mmanya, ha na-egbukasị onwe ha ahụ, na-ewezugakwa onwe ha site nʼebe m nọ.


Ma anya gị dị ọcha nke ukwuu, na ọ dịghị elekwasị ajọ ihe anya; ị naghị anabatakwa mmegbu. Ma gịnị mere i ji gba ndị aghụghọ nkịtị? Gịnị mere i ji gba nkịtị mgbe ndị ajọ omume na-eloda ndị bụ ndị ezi omume karịa ha?


“ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.


Ọ sịrị ha, “Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu; dị ka e dere ya sị, “ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.


Ha na-ekwupụta na ha maara Chineke, ma ha ji omume ha na-agọnarị ya. Ha bụkwa ndị na-akpọ mmadụ ibe ha asị, ndị isiike, na ndị na-adịghị ike nʼezi ọrụ ọbụla.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan