Jeremaya 11:8 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a8 Ma ha jụrụ ige ntị. Ha akpọkwaghị okwu m mkpa dịrị ha. Kama ha jegharịrị nʼisiike nke obi ọjọọ ha. Ọ bụ nke a mere m ji mee ka ọbụbụ ọnụ niile nke ya na ọgbụgba ndụ ahụ so bịakwasị ha, dịka m buru ụzọ nye nʼiwu, ma ihe ndị a emeghị ka ha jezie ije.’ ” Faic an caibideilBible Nso8 Ma ha egeghi nti, ha atọghi kwa nti-ha n'ala, ha we jegharia, onye ọ bula n'isi-ike nke obi ọjọ ha: M'we me ka okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu a biakwasi ha, bú nke M'nyere n'iwu ka ha me, ma ha emeghi ha. Faic an caibideil |
Mgbe mgbe ka m ziteere unu ụmụ ohu m bụ ndị amụma, ndị bịara gwa unu okwu sị, “Dozienụ ụzọ unu, sitekwanụ nʼajọ omume unu tụgharịa. Unu niile nʼotu nʼotu, unu agbasola chi ndị ọzọ ife ha. Ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-ebi nʼala a m nyere unu na nna nna unu ha.” Ma unu jụrụ ịṅa ntị, jụkwa ige m ntị.
Nʼihi na anyị aghaghị ime ihe ndị ahụ anyị kpebiri ime. Anyị ga-achụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Anyị ga-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ dịka anyị na nna anyị ha, ndị eze anyị na ndịisi ọchịchị anyị mere nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem. Nʼoge ahụ, anyị na-eriju afọ, ihe na-agakwara anyị nke ọma, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị anyị.