Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 11:12 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ndị obodo Juda na ndị bi na Jerusalem ga-apụ kpọkuo chi ndị ahụ niile ha na-achụrụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ma chi ndị a agaghị enyere ha aka mgbe mbibi a bịakwasịrị ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

12 Obodo nile nke Juda na ndi bi na Jerusalem gēje kwa tikuru chi nile nke ha onwe-ha nēsurere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ: ma ọ dighi nzọputa ma-ọli ha gāzọputa ha na mb͕e ihe ọjọ ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 11:12
10 Iomraidhean Croise  

Nʼoge nsogbu ya, eze Ehaz gakwara nʼihu bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị.


“Chịkọtaanụ onwe unu, gbakọtanụ, bịanụ nso, unu ndị si na mba niile gbapụta ọsọ ndụ. Ha amaghị ihe bụ ndị a na-ebugharị chi osisi e ji aka mee, ndị na-ekpekwara chi ndị ahụ na-enweghị ike ịzọpụta ekpere.


Ha na-ebuli arụsị ahụ buru ya nʼubu ha, buru ya debe ya nʼọnọdụ ya, nʼebe ahụ ka ọ na-akwụrụ. Ọ dịghị apụ site nʼebe ahụ jegharịa. Ọ bụrụ na mmadụ e tikuo ya mkpu, ọ gaghị aza, ọ pụghị ịzọpụtakwa ha pụọ na nsogbu ha niile.


Ma ndị m echezọọla m. Ha na-achụ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị na-enweghị isi, bụ arụsị ndị ahụ mere ka ha sọọ ngọngọ nʼụzọ ha niile. Ha sụrụ ngọngọ hapụ ịgbasokwa ụzọ ọma ahụ dị site na mgbe ochie. Kama ha na-eje ije nʼụzọ ọhịa, nke na-enweghị ụkpụrụ, nke a na-ewuzighị ewuzi.


Olee ebe chi ndị ahụ i meere nye onwe gị nọ? Ka ha bịa, ma ọ bụrụ na ha nwere ike ịzọpụta gị, mgbe nsogbu bịakwasịrị unu. Nʼihi na gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dịka i si nwee ọtụtụ obodo.


Gịnị mere unu na-eji ọrụ aka unu na-akpasu m iwe, na-esurere chi ndị ọzọ ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼala Ijipt, ebe unu bịara ibi? Unu onwe unu ga-ala onwe unu nʼiyi, mekwaa onwe unu ihe ịbụ ọnụ nakwa ihe nkọcha nʼetiti mba niile dị nʼụwa.


Ọ ga-asịkwa, “Ugbu a, olee ebe chi niile ha nọ, bụ oke nkume ahụ ha gbabara izere ndụ nʼime ya,


chi ndị ahụ riri abụba ihe ịchụ aja ha, ṅụọkwa mmanya ha ji chụọ aja ihe ọṅụṅụ? Ha bilie bịa nyere unu aka! Ha bụrụ ụlọ ndo nye unu!”


Kpọkuonụ chi ndị ahụ bụ ndị unu họpụtaara onwe unu, ka ha zọpụta unu mgbe ọbụla nsogbu dakwasịrị unu!”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan