Jeremaya 11:11 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a11 Nʼihi ya, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eme ka mbibi, nke ha na-enweghị ike ịgbanarị, bịakwasị ha. Ọ bụrụkwa na ha akpọkuo m agaghị m aṅa ntị. Faic an caibideilBible Nso11 N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ, nke ha nāpughi isi nime ya puta, biakute ha; ha gētikukwam, ma M'gaghi-ege ha nti. Faic an caibideil |
Ọ bụrụ na ha ajụọ gị si, ‘Ebee ka anyị ga-aga?’ Gwa ha na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Ndị e debere nʼihi ọnwụ ga-anwụ, ndị e debere nʼihi mma agha ka mma agha ga-egbu; ndị e debere nʼihi ụnwụ ka ụnwụ ga-egbu, otu a kwa, ndị e debere nʼihi ịdọta nʼagha, ka a ga-adọta nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.’