Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 11:11 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Nʼihi ya, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eme ka mbibi, nke ha na-enweghị ike ịgbanarị, bịakwasị ha. Ọ bụrụkwa na ha akpọkuo m agaghị m aṅa ntị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

11 N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ, nke ha nāpughi isi nime ya puta, biakute ha; ha gētikukwam, ma M'gaghi-ege ha nti.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 11:11
35 Iomraidhean Croise  

‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga iweta mbibi ga-adakwasị ebe a na ndị niile bi nʼime ya, dịka ihe niile e dere nʼime akwụkwọ nke eze Juda gụrụ, si dị.


‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga iweta mbibi ga-adakwasị ebe a na ndị niile bi nʼime ya, ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a, bụ nke a gụpụtara nʼihu eze Juda.


Nʼezie, Chineke adịghị aṅa ntị nʼarịrịọ efu ha; Onye pụrụ ime ihe niile a dịghị elebara ya anya.


Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha. Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha.


Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m, Onyenwe anyị agaraghị ege m ntị;


“Agaghị m ege ntị nʼakwa unu, ọ bụ ezie na unu ga na-akpọ m. Unu ga-achọkwa m ma unu agaghị achọta m.


Onye a na-abara mba mgbe niile ma ọ naghị anata ndụmọdụ, nʼotu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ gaghị ekulikwa ọzọ.


Mgbe unu na-agbasa aka unu nʼekpere, agaghị m aṅa unu ntị; ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, agaghị m aṅa ntị.” Nʼihi na aka unu jupụtara nʼọbara!


Ihe egwu, na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya dị na-eche unu, unu ndị niile bi nʼụwa.


“Ekperela ndị a ekpere, arịọkwala arịrịọ ọbụla nʼihi ha. Nʼihi na agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọku m nʼoge ihe mgbu ha.


Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ onye ahụ kụnyere gị nʼala, e nyela iwu na mbibi ga-abịakwasị gị, nʼihi na ndị Izrel na Juda emeela ihe ọjọọ, kpasuo m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal.


Ọ bụ ezie na ha na-ebu ọnụ, agaghị m ege ntị nʼakwa ha; ọ bụrụkwa na ha achụọrọ m aja nsure ọkụ, maọbụ aja mkpụrụ onyinye, agaghị m anabata ha. Kama, aga m eji mma agha na ụnwụ, na ọrịa dị iche iche bibie ha.”


“Juda na-eru ụjụ, ndị bi nʼobodo ya niile na-ahụjukwa anya. Ha na-akwa akwa nʼihi ala ahụ, ụda ịkwa akwa ha eruokwala Jerusalem.


Ọ bụrụ na ha ajụọ gị si, ‘Ebee ka anyị ga-aga?’ Gwa ha na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Ndị e debere nʼihi ọnwụ ga-anwụ, ndị e debere nʼihi mma agha ka mma agha ga-egbu; ndị e debere nʼihi ụnwụ ka ụnwụ ga-egbu, otu a kwa, ndị e debere nʼihi ịdọta nʼagha, ka a ga-adọta nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.’


“Ugbu a, gwa ndị Juda na ndị ahụ bi na Jerusalem, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Lee, ana m akwado mbibi nke ga-abịakwasị unu; ana m echekwa echiche ọjọọ megide unu. Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu site nʼụzọ ọjọọ ya chegharịa, ya meekwa ka ụzọ ya na omume ya zie ezi.’


“Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke nke Izrel sịrị, ‘Geenụ ntị! Ana m aga ime ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru okwu ya bịakwasị obodo a, na obodo nta niile gbara ya gburugburu, nʼihi na ha bụ ndị isiike, ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m.’ ”


Sị ha, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda, na ndị Jerusalem. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke Izrel kwuru. Geenụ ntị! Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ala a, ụdị ihe ọjọọ ga-eme ka ntị ọbụla nụrụ ya zụọ wuruwuru.


“Nʼihi ya, ụzọ ha na-agbaso ga-adị ka ebe na-amị amị; a ga-achụbanye ha nʼọchịchịrị ebe ahụ ka ha ga-anọkwa daa. Aga m eme ka ihe mbibi bịakwasị ha nʼafọ ahụ, a ga-ata ha ahụhụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.


Ndị ọzụzụ atụrụ agaghị enwe ebe ha ga-agbaga ọsọ; ndị ndu igwe ewu na atụrụ agaghị enwekwa ebe ha ga-ezo onwe ha.


“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel kwuru: ‘Geenụ ntị! Lee, ana m aga ime ka ihe ọjọọ bịakwasị Juda na ndị niile bi na Jerusalem, dịka m kwuru na ọ ga-adị. Nʼihi na agwala m ha okwu, ma ha jụrụ ige m ntị. Akpọrọ m ha oku, ma ha jụrụ ịza.’ ”


Aga m ata ya na ụmụ ya, na ndị ozi ya ahụhụ nʼihi ajọ omume ha. Aga m eme ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru ihe banyere ya bịakwasị ha na ndị niile bi na Jerusalem, na ndị Juda niile, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị.’ ”


Nụrụ, gị ụwa, lee, ana m aga iwetara ndị a ịla nʼiyi, nke bụ mkpụrụ atụmatụ ọjọọ ha niile, nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼokwu m. Ha jụkwara ịnabatara onwe ha iwu m.


“Dịka i si akpọ oku ka a bịa nʼụbọchị oriri, otu a ka i si kpọkọta ihe egwu niile ka ha bịakwasị m nʼakụkụ niile. Nʼụbọchị nke iwe Onyenwe anyị ọ dịghị onye gbapụrụ ọsọ, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ ndụ; ndị m lekọtara, zụlitekwa ka ndị iro m lara nʼiyi.”


“Nwa nke mmadụ, ndị ikom ndị a na-efe arụsị nʼime obi ha, ma tinyekwa ihe ịsụ ngọngọ nke ajọ omume ya nʼihu ha. Aga m ekwenye ka ha jụta m ase ọbụla?


“Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “ ‘Oke mbibi, oke mbibi nke a na-anụbeghị ụdị ya mbụ. Lee, ka ọ na-abịa.


Nʼihi ya, aga m eme ka ha nụrụ ụfụ iwe m, ọ dịkwaghị onye m ga-ahapụ. Ọ bụrụkwa na ha anọgide na-ebe akwa nʼoke olu, agaghị m aṅa ha ntị.”


Ọ ga-adị ka onye si nʼihu ọdụm na-agbapụ ma zute anụ ọhịa bịa, maọbụ onye gbabara nʼụlọ ya izuike ma tụkwasị aka ya nʼaja ụlọ, agwọ ataa ya.


Mgbe ahụ ha ga-akpọku Onyenwe anyị, ma ọ gaghị aza ha! Mgbe oge ahụ bịaruru, ọ ga-ezo ihu ha site nʼebe ha nọ nʼihi ihe ọjọọ nke ha mere.


“ ‘Ebe ọ bụ na mgbe m kpọrọ ha, ha egeghị ntị, agaghị m ege ntị mgbe ha ga-akpọ m,’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.


Mgbe ha ga na-asị udo, na nchekwa dị, mgbe ahụ, na mberede, mbibi ga-abịakwasị ha dị ka ihe mgbu sị adakwasị nwanyị ime na-eme, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara inwe ike ịgbapụ.


Ọ na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe ọ sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, ọ nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan