Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 10:5 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Arụsị ha yiri osisi eguzobere nʼubi kukumba maka iji chụọ anụ ufe ọsọ, ha adịghị ekwu okwu. A na-ebugharị ha nʼaka nʼihi na ha adịghị eje ije. Unu atụla ha egwu, nʼihi na ha apụghị imerụ unu ahụ, ha enwekwaghị ike imere unu ihe ọma ọbụla.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

5 Ha di ka nkwu, ihe akpuru akpu ka ha bu, ha adighi-ekwu okwu: aghaghi ibu ha ebu, n'ihi na ha adighi-azọ ije. Unu atula egwu ha; n'ihi na ha agaghi-eme ihe ọjọ, ọzọ kwa, ime izi ihe adighi ha n'aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 10:5
16 Iomraidhean Croise  

Ya mere, ndị amụma Baal weere oke ehi ahụ e nyere ha doziekwa ya. Mgbe ahụ, ha kpọkuru aha Baal, chi ha. Site nʼụtụtụ tigide mkpu ruo nʼetiti ehihie na-asị “O Baal, biko, zaa anyị.” Ma o nweghị ihe ha nụrụ site nʼọnụ Baal. Ọ dịkwaghị onye zara ha. Ha malitere ite egwu gburugburu ebe ịchụ aja ahụ ha kwadoro.


Iwe Onyenwe anyị dị ukwuu megide Amazaya. O zigaara ya onye amụma, onye sịrị, “Nʼihi gịnị ka iji ajụ ase site nʼaka chi nke ndị ahụ, bụ ndị na-enweghị ike ịzọpụta ndị ha site nʼaka gị?”


Mgbe Moab ga-egosipụta onwe ya nʼebe ya dị elu, ọ na-eme naanị ka ike gwụ ya, mgbe ọ ga-aga ikpe ekpere nʼihu mmụọ ya, o nweghị uru nke a ga-abara ha.


“Chịkọtaanụ onwe unu, gbakọtanụ, bịanụ nso, unu ndị si na mba niile gbapụta ọsọ ndụ. Ha amaghị ihe bụ ndị a na-ebugharị chi osisi e ji aka mee, ndị na-ekpekwara chi ndị ahụ na-enweghị ike ịzọpụta ekpere.


Bel na Nebo, arụsị ndị Babilọn makpu amakpu. Lee, arụsị niile ha ka ebukwasịrị ha nʼazụ ịnyịnya ibu. Arụsị niile apịrị apị bụ nke a na-ebugharị bụ ibu dị arọ, ibu arụ nye ụmụ anụmanụ na-ada mba!


Ha na-ebuli arụsị ahụ buru ya nʼubu ha, buru ya debe ya nʼọnọdụ ya, nʼebe ahụ ka ọ na-akwụrụ. Ọ dịghị apụ site nʼebe ahụ jegharịa. Ọ bụrụ na mmadụ e tikuo ya mkpu, ọ gaghị aza, ọ pụghị ịzọpụtakwa ha pụọ na nsogbu ha niile.


Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ. Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ. Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ; ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha.


Ahụhụ dịrị onye ahụ na-agwa osisi okwu sị, ‘Dịrị ndụ.’ Ma ọ bụ nkume nke na-apụghị ikwu okwu, ‘Teta nʼụra.’ O nwere ike izi mmadụ ihe? Lee, ọ bụ ihe eji ọlaọcha na ọlaedo machie, ma ọ dịghị nkuume ọbụla dị nʼime ya.”


Unu matara na mgbe unu bụ ndị na-amaghị Chineke, e duru unu nʼotu ụzọ maọbụ nke ọzọ, duhie unu ụzọ iso arụsị ndị ahụ dara ogbi.


Ya mere, ihe banyere nri a chụrụ nʼaja nye arụsị, anyị maara na “Arụsị abụghị ihe ọbụla nʼụwa”, matakwa na “Chi ọzọ adịghị ma ọ bụghị otu Chineke.”


Nʼebe ahụ, unu ga-efe chi ndị bụ ọrụ aka mmadụ nke e ji osisi tụọ na nke e ji nkume pịa, nke na-adịghị ahụ ụzọ, nke na-adịghị anụ ihe, nke na-apụghị iri nri ma ọ bụkwanụ ịnụ isisi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan