Jeremaya 10:11 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a11 “Ihe ndị a ka unu ga-agwa ha, ‘Chi ndị ahụ niile a na-esiteghị nʼaka ha mee eluigwe na ụwa niile ga-ala nʼiyi. A ga-ewezuga ha site nʼụwa na nʼokpuru eluigwe niile.’ ” Faic an caibideilBible Nso11 Otú a ka unu gāsi ha, Chi nile nke nēmeghi elu-igwe na uwa, ha gāla n'iyì pua n'uwa na n'okpuru elu-igwe, bú chi ndia. Faic an caibideil |
“Kwusaa ya na mba niile, mee ka a nụrụ ya; bulie ọkọlọtọ mgbe a na-ekwusa ya. Kwupụta ihe niile, ezokwala ihe ọbụla, kama kwusaa ya sị, ‘A ga-adọta Babilọn nʼagha. Ihere ga-emesịa mee Bel; otu a kwa, egwu ga-ejupụta Maduk obi. A ga-eme ka ihere mee oyiyi ya niile a kpụrụ akpụ; oke egwu ga-ejidekwa arụsị ya niile.’