Jeremaya 10:10 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a10 Ma naanị Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie. Ọ bụ Chineke dị ndụ, na Eze nke ebighị ebi. Mgbe iwe were ya, ụwa na-ama jijiji. Mba niile apụghịkwa ịnagide iwe ya dị ọkụ. Faic an caibideilBible Nso10 Ma Jehova bu Chineke n'ezi-okwu; Ya onwe-ya bu Chineke di ndu, na eze nādi mb͕e ebighi-ebi: n'iwe-Ya uwa nāma jijiji, mba nile apughi kwa inagide iwe-Ya di ọku. Faic an caibideil |
Ma eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị, ga-anụ okwu ahụ nke Rabashaka, bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa Chineke dị ndụ emo. Eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.”
Mgbe oge a gafesịrị, mụ bụ Nebukadneza leliri anya m elu. Mgbe ahụ kwa ka m ghọrọ mmadụ nwere uche ọzọ. Etokwara m, ma kpọọkwa isiala nye Onye ahụ kachasị ihe niile elu, sọpụrụkwa Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Onye ọchịchị ya na-adịghị agwụ agwụ, onye alaeze ya na-adị site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.