Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 1:3 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ozi ndị ọzọ rukwara ya ntị nʼoge Jehoiakim nwa Josaya, bụ eze Juda, ruokwa nʼọnwa nke ise nʼafọ nke iri na otu nke Zedekaya nwa Josaya, bụ eze Juda kwụsịrị, mgbe a dọkpụụrụ ndị Jerusalem nʼagha buru ha ka ha gaa biri na mba ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

3 O ru-kwa-ra ya nti n'ubọchi Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, rue mb͕e arọ nke-iri-na-otù nke Zedekaia nwa Josaia, bú eze Juda, gwusiri: rue mb͕e emere ka Jerusalem je biri n'ala ọzọ n'ọnwa nke-ise.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 1:3
19 Iomraidhean Croise  

Fero Neko mere Eliakịm nwa nwoke Josaya, eze, nʼọnọdụ Josaya bụ nna ya. Ọ gụgharịrị aha Eliakịm ka ọ bụrụ Jehoiakim. Ma o duuru Jehoahaz gaa Ijipt, ebe ọ nọ nwụọ.


O mere nwanne nna Jehoiakin, bụ Matanaya, eze nʼọnọdụ ya. Ọ gụgharịrị ya aha, kpọọ ya Zedekaya.


Ụmụ ndị ikom Josaya: Johanan nwa mbụ ya, na Jehoiakim nwa ya nke abụọ, na Zedekaya nwa ya nke atọ, na Shalum nwa ya nke anọ.


Okwu Onyenwe anyị bịakwutere m, na-asị,


Mgbe Nebukadneza eze Babilọn na ndị agha ya niile, na mba niile dị nʼalaeze nke ọ na-achị na-ebuso Jerusalem na obodo niile gbara ya gburugburu agha, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị,


Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya ntị nʼoge ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda sị ya,


“Were akwụkwọ detuo okwu ahụ niile m gwarala gị banyere Izrel, na Juda, na banyere ndị mba ọzọ dị iche iche, bụ okwu ndị ahụ m bidoro ịgwa gị site nʼoge ọchịchị Josaya ruo ugbu a.


Nʼụbọchị nke itoolu, nʼọnwa nke anọ, nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị Zedekaya, ha gwupuru mgbidi obodo ahụ.


“Gwanụ ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a, ‘Mgbe unu na-ebu ọnụ nʼọnwa nke ise ọbụla, na nʼọnwa nke asaa ọbụla, iri afọ asaa ndị a niile gara aga, ọ bụ mụ ka unu na-eburu ọnụ?


Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu: “Ibu ọnụ unu na-ebu nʼọnwa nke anọ, ọnwa nke ise, ọnwa nke asaa na nʼọnwa nke iri ga-aghọrọ unu oge ịṅụrị ọṅụ na oge obi ụtọ. Ha ga-abụrụ Juda mmemme obi ụtọ. Nʼihi ya, hụnụ eziokwu na udo nʼanya.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan