Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 1:17 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 “Bilie ọtọ, jikere onwe gị, ka ị pụọ gaa gwa ha ihe ọbụla m nyere gị nʼiwu. Atụkwala ụjọ ha, ma ọ bụghị ya, aga m emenye gị egwu nʼihu ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

17 Ma gi onwe-gi, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, bilie, gwa ha ihe nile Mu onwem nēnye gi n'iwu: atula ujọ ha, ka M'we ghara ime ka i tu ujọ n'iru ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 1:17
26 Iomraidhean Croise  

Ma ike Onyenwe anyị bịakwasịrị Ịlaịja. Ọ fanyere ọnụ uwe mwụda ya na belịt o kere nʼukwu, gbapụ ọsọ buru Ehab ụzọ gbaruo obodo Jezril.


Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Ịlaịja okwu sị ya, “Atụla egwu! Soro ya gaa!” Ya mere, Ịlaịja sooro onyeisi agha ahụ gaa nʼihu eze.


Ịlaisha sịrị Gehazi, “Ngwa, were ihe ike nʼukwu jikọta uwe mwụda gị, werekwa mkpanaka m nʼaka gị, bilie gaa Shunem. Mgbe ị na-aga ekelekwala onye ọbụla ekele. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ekelee gị, azala ekele ya. Gaa nʼụlọ ahụ. I ruo, tụkwasị mkpanaka m nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ.”


Emesịa, Ịlaisha onye amụma, kpọrọ otu onye nʼime ụmụ ndị amụma sị ya, “Jikere, fanye ọnụ uwe mwụda gị nʼeriri ikere nʼukwu gị, werekwa karama mmanụ oliv a nʼaka gị, bịa ka ị gaa Ramọt Gilead.


Ugbu a, jikere onwe gị dịka dimkpa nʼihi na enwere m ajụjụ m ga-ajụ gị nke m chọrọ ka i nye m ọsịsa ha.


Chineke gwara ya sị, “Aga m anọnyere gị. Nke a ga-abụ ihe ama nye gị na ọ bụ m na-eziga gị. Mgbe i sitere nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel, unu niile ga-efe m ofufe nʼelu ugwu a.”


Ị ga-agwa Erọn ihe niile m gwara gị. Ọ ga-ekwukwa ha nʼihu Fero, rịọọ ya ka o kwere ka ụmụ Izrel hapụ ala Ijipt.


Nʼihi na lee, site taa gaa nʼihu emeela m gị ka ị dịrị ka obodo e wusiri ike. Ị dịkwa ka mgbidi e ji igwe kpụọ, na dịka ibo e ji ọla dị arọ kpụọ, iguzogide ala ahụ niile. Iguzogide ndị eze Juda niile, ndịisi ala Juda niile, na ndị nchụaja niile, na ndị mmadụ ọzọ.


Mee ka ihere mee ndị na-akpagbu m. Ekwekwala ka ihere mee m. Mee ka ha tụọ ụjọ, ma chebe m site nʼihe egwu. Mee ka ụbọchị mbibi bịakwasị ha, werekwa okpukpu ihe mbibi abụọ tipịa ha.


Ka onye amụma ahụ rọrọ nrọ kọgharịa nro ọ rọrọ. Otu a kwa, ka onye ahụ okwu m dị nʼọnụ ya nọgidekwa na-ekwusa ya nʼeziokwu. Nʼihi na gịnị ka okporo ọka na mkpụrụ ọka nwekọrọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.


Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndịisi ọchịchị ahụ na mmadụ niile nọ nʼebe ahụ okwu sị ha, “Ọ bụ Onyenwe anyị zitere m ibu amụma megide ụlọnsọ a na obodo a. Okwu niile m kwuru, nke unu nụrụ, bụ ihe Onyenwe anyị ziri m ikwu.


Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Guzo nʼogige ụlọnsọ Onyenwe anyị. Nọdụ nʼebe ahụ gwa ndị niile si nʼobodo Juda bịa ịkpọ isiala nʼụlọnsọ Onyenwe anyị okwu. Gwa ha ihe ahụ niile m nyere gị nʼiwu. Mee ka ihe ndị ahụ niile m nyere gị nʼiwu rute ha ntị, na-afọdụghị otu.


Baruk nwa Neraya mere dịka Jeremaya onye amụma si gwa ya. Ọ gụpụtara okwu Onyenwe anyị, nke dị nʼakwụkwọ ahụ, nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.


Ị bịara nso mgbe m kpọkuru gị. Ị sịrị, “Atụla egwu.”


“Bilie, jee nʼobodo ukwu ahụ bụ Ninive, kwusaara ya ozi ahụ m ziri gị.”


“Keenụ ajị nʼume, meenụ ka oriọna unu na-enwu enwu.


Unu hụrụ na m ahapụghị ime ka unu mara ihe ọbụla ga-abara unu uru, mgbe ọbụla m na-akụziri unu ihe nʼụlọ maọbụ nʼihu ọha.


Nʼihi na-esepụghị m aka ikwupụta nzọpụta Chineke nye unu.


Anaghị anya isi nʼihi na ana m ezisa oziọma, maka na nke ahụ bụ ọrụ e nyere m nʼiwu ka m rụọ. Ahụhụ dịịrị m ma ọ bụrụ na m ezisaghị oziọma.


Anyị tara ahụhụ na mbụ e mekwara anyị ihe ihere na Filipai dịka unu maara, ma site nʼinyeaka Chineke anyị nwere obi ike ịgwa unu oziọma ya, ọ bụladị mgbe a na-eguzogide anyị nʼebe ọ dị ukwuu.


Nʼihi ya, werenụ uche unu niile jikere ịrụ ọrụ, anya dokwaa unu. Nweenụ olileanya zuruoke nʼamara nke a ga-ewetara unu mgbe a ga-ekpughe Jisọs Kraịst.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan