Jeremaya 1:15 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a15 Ma ugbu a, ana m akpọku ndị niile bi nʼalaeze dị nʼugwu,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Ndị eze ha ga-abịa doo ocheeze ha nʼọnụ ụzọ ama e si abata Jerusalem, imegide ogologo mgbidi nke obodo ahụ gburugburu, na imegidekwa obodo niile nke Juda. Faic an caibideilBible Nso15 N'ihi na, le, M'gaje ikpọ ab͕uru nile nke ala-eze nile nke Ugwu òkù, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; ha gābia kwa, do, onye ọ bula oche-eze-ya, n'oghere ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem, na imegide mb͕idi-ya nile buruburu, na imegide obodo nile nke Juda. Faic an caibideil |
Aga m akpọku ndị ahụ si nʼugwu, ha na ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka ha bịa megide ala a, na ndị bi nʼime ya. Ha ga-emegidekwa mba niile gbara ala a gburugburu. Aga m ebibi ha niile kpamkpam, mee ha ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe a na-elelị. Ha ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.
“Aga m ewezuga ndị agha ahụ si nʼugwu, zipụ ha nʼebe tere anya, m ga-achụba ha nʼala kpọrọ nkụ, na ebe tọgbọrọ nʼefu. Ndị nọ nʼihu ga-erugbu nʼosimiri Nnu dị nʼọwụwa anyanwụ; ndị nọ nʼazụ ka m ga-erugbu nʼosimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ. Isisi ọjọọ ya ga-esipụta, isisi nke ure ya ga-arịgokwa.” Nʼezie, ọ meela ihe ndị dị ukwuu dị iche iche.