Jeremaya 1:14 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a14 Onyenwe anyị sịrị m, “Ihe egwu ga-esite nʼugwu bịakwasị ndị niile bi nʼala a. Faic an caibideilBible Nso14 Jehova we sim, N'Ugwu ka agēsi tọpu ihe ọjọ idakwasi ndi nile bi n'ala nka. Faic an caibideil |
Aga m akpọku ndị ahụ si nʼugwu, ha na ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka ha bịa megide ala a, na ndị bi nʼime ya. Ha ga-emegidekwa mba niile gbara ala a gburugburu. Aga m ebibi ha niile kpamkpam, mee ha ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe a na-elelị. Ha ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.
Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee ka mmiri si ala elu nʼakụkụ ugwu; ha ga-aghọkwa mmiri nke na-erubiga oke. Ha ga-erukwasị ala ahụ, kpuchiekwa ihe niile dị nʼime ya, ọ ga-ekpuchikwa obodo niile dị nʼala ahụ, na ndị bi nʼime ya. Ndị niile bi nʼala ahụ ga-eti mkpu akwa, mmadụ niile ga-akwasikwa akwa ike.
“Aga m ewezuga ndị agha ahụ si nʼugwu, zipụ ha nʼebe tere anya, m ga-achụba ha nʼala kpọrọ nkụ, na ebe tọgbọrọ nʼefu. Ndị nọ nʼihu ga-erugbu nʼosimiri Nnu dị nʼọwụwa anyanwụ; ndị nọ nʼazụ ka m ga-erugbu nʼosimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ. Isisi ọjọọ ya ga-esipụta, isisi nke ure ya ga-arịgokwa.” Nʼezie, ọ meela ihe ndị dị ukwuu dị iche iche.