Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 1:13 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ na-asị, “Gịnị ka ị na-ahụ?” A sịrị m, “Ana m ahụ ite mmiri ọkụ, nke na-agbọ agbọ, nke e mere ka o hulata chee ọnụ ya na ndịda.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

13 Okwu Jehova we ruem nti nke ub͕ò abua, si, Gini ka gi onwe-gi nāhu? M'we si, Ite afunwuworo ọku n'okpuru ya ka m'nāhu; iru-ya site-kwa-ra n'Ugwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 1:13
10 Iomraidhean Croise  

Ihe mere Fero ji rọọ nrọ a ugboro abụọ bụ nʼihi na Chineke ekpebiela na ihe ndị a ga-emezuriri. Chineke ga-emekwa ya nʼoge na-adịghị anya.


Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị. Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu. Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee, baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya.


Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụrụ m ajụjụ sị m, “Jeremaya, gịnị ka ị hụrụ?” Azara m sị ya, “Ahụrụ m mkpụrụ fiig. Ụfọdụ dị nnọọ ezi mma, ma ndị ọzọ jọrọ njọ. Ha adịghịkwa mma nracha.”


Ha na-asị, ‘Oge a ga-ewuzi ụlọ ndị ahụ ọ dịghị nso? Obodo a bụ ite igwe, anyị onwe anyị bụkwa anụ dị nʼime ya.’


“Nʼihi ya ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ji sị, ozu ndị ahụ niile tọgbọ nʼokporoụzọ obodo unu bụ anụ ndị ahụ unu gburu egbu, obodo a bụkwa ite. Ma aga m eme ka unu site nʼime ya pụta.


“Nʼihi ya, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, ọ dịghịkwa okwu m nke a ga-atụfu oge ọzọ nʼime ya, ihe ọbụla m kwuru ka a ga-emezu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ”


Ọ sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” A sịrị m: “Otu nkata nke mkpụrụ osisi chara acha jupụtara nʼime ya.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Oge ọgwụgwụ abịakwasịla ndị m, Izrel. Agaghị m ewezugakwa ntaramahụhụ dịrị ha.”


Ọ sịrị m, “Gịnị ka ị na-ahụ?” Asịrị m, “Ana m ahụ ihe ịdọba oriọna e ji ọlaedo mee. O nwere ọkwa nʼisi ya, nweekwa oriọna asaa, nke na-enwu nʼelu ya. Oriọna asaa ndị a nwekwara okporo asaa e si agbanye mmanụ nʼime ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan