Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Jeremaya 1:10 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Lee, taa, ana m eme gị onye nlekọta mba dị iche iche na alaeze niile, ihopu na ikwada, ịla nʼiyi na ịtịkpọkwa ha, i wulite ma kụọkwa.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

10 le, emewom gi ta ka i lekọta mba nile, lekọta kwa ala-eze nile, iropu, na ikwada, na ime ka ha la n'iyì, na itikpọ, na iwu ulo, na iku ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Jeremaya 1:10
29 Iomraidhean Croise  

Ugbu a, Ịlaịja onye Tishbe, onye si obodo Tishbe, nke dị nʼala Gilead, sịrị Ehab, “Eji m aha Onyenwe anyị Chineke Izrel dị ndụ, onye m na-efe na onye m na-ejere ozi na-agwa gị na igirigi agaghị ada, mmiri agaghị ezo ọzọ nʼafọ ndị a na-abịa karịa ma ọ bụghị naanị site nʼokwu ọnụ m!”


Onye ọbụla gbanarịrị Hazael ga-anwụ nʼaka Jehu. Otu a kwa, ndị niile gbanarịrị mma agha Jehu ka Ịlaisha ga-egbu.


oge igbu egbu; na oge ịgwọ ọrịa, oge itikpọ na oge iwuzi ewuzi,


“Amaara m gị tupu a tụrụ ime gị, tupu a mụọ gị, edoro m gị nsọ, ahọpụtakwara m gị dịka onye amụma nye mba niile.”


Anya m ga-adịkwasị ha nʼahụ ịhụ na ihe gaara ha nke ọma. Aga m akpọghachitekwa ha nʼala a. Aga m ewulikwa ha elu ghara ikwada ha; Aga m akụ ha dịka osisi ghara ihopu ha.


Aga m emekwa ka ihe niile m buru ụzọ kwuo megide ala ahụ bịakwasị ya, bụ ihe niile e dere nʼakwụkwọ a, na ihe niile Jeremaya buru nʼamụma megide mba niile dị iche iche.


Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ.” Ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.


Ndagwurugwu ahụ niile ebe a tụnyere ozu ndị mmadụ, na ebe e kpofuru ntụ, na mgbada ugwu ahụ niile ebe e doziri edozi maka ịkụ ihe, ruo na ndagwurugwu iyi Kidrọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama ịnyịnya, ga-aghọkwa ebe dị nsọ nye Onyenwe anyị. A gaghị ehopukwa obodo ahụ ọzọ, maọbụ tikpọọ ya.”


“Were akwụkwọ detuo okwu ahụ niile m gwarala gị banyere Izrel, na Juda, na banyere ndị mba ọzọ dị iche iche, bụ okwu ndị ahụ m bidoro ịgwa gị site nʼoge ọchịchị Josaya ruo ugbu a.


Nʼihi na anya m na-ele ha abụghị maka ime ha mma, kama ọ bụ maka ime ha ihe ọjọọ. Ndị Juu niile bi nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼoke ụnwụ, tutu ruo mgbe e bibichara ha dum.


Ma ihe ndị a ka ị ga-agwa ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Aga m akwada ihe ndị ahụ niile m wuru, hopukwa ihe ndị ahụ niile m kụrụ nʼala a niile.


“Nwa nke mmadụ mee ụzọ abụọ nke mma agha eze Babilọn ga-eso. Ka ụzọ abụọ ndị a malite nʼotu obodo. Dee ihe ngosi manye ha nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ.


Onyenwe anyị sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ị ga-ekpe Ohola na Oholiba ikpe? Mgbe ahụ, guzogide ha mee ka ha mara ihe arụ niile ha na-eme.


“Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa nʼihi usuu ndị agha Ijipt niile, wezuga ha baa nʼokpuru ụwa ma ndị inyom mba dị iche iche dị ukwuu, ha na ndị ahụ na-arịdaru nʼolulu.


Mgbe ahụ, mba niile gbara unu gburugburu, bụ ndị fọdụrụ, ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị wuziri ebe niile e tikpọrọ etikpọ, kụọkwa mkpụrụ nʼebe niile tọgbọrọ nʼefu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ekwuola, aga m emekwa ya.’


Ọ dịkwa ka ọhụ mbụ m hụrụ, nke m buru ụzọ hụ nʼakụkụ ọnụ mmiri Keba, ya na nke m hụrụ na Jerusalem mgbe ọ bịara ibibi obodo ahụ. Adara m nʼala kpugide ihu m nʼaja.


Nke mere m ji si nʼọnụ ndị amụma gbukasịa ha. Ejirila m okwu ọnụ m gbuo ha, ikpe ọmụma m na-achawapụta dịka ìhè.


Nʼezie Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị adịghị eme ihe ọbụla tutu ruo mgbe o buru ụzọ gosi ya ndị na-ejere ya ozi bụ ndị amụma.


“Nʼụbọchị ahụ, “aga m emekwa ka ụlọ ikwu Devid dara ada guzoziekwa. Aga m emezi akụkụ ya niile gbajiri agbaji, mee ka akụkụ ya niile dakpọsịrị adakpọsị guzozie dịka ọ dị na mbụ. Aga m ewugharịkwa ya, mee ka ọ dịrị ka ọ dị na mbụ.


Ọ bụ na okwu m na iwu bụ nke m nyere ụmụ ohu m ndị amụma, ọ bụ na ha emezughị nʼebe ndị nna nna unu ha nọ? “Mgbe ahụ, ha chegharịrị ma kwuo, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, emesola anyị mmeso dịka ụzọ anyị na omume anyị si dị. O mekwara ya dịka o si zube na ọ ga-eme ya.’ ”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan