Ọnụọgụgụ 34 - Bible Nso1 Jehova we gwa Moses okwu, si, 2 Nye umu Israel iwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu ganābata n'ala Kenean, (nka bu ala nke gēru unu aka n'ihe-nketa, bú ala Kenean dika ókè-ala-ya-nile si di,) 3 akuku Ndida unu nwe-kwa-ra gēsite n'ọzara Zin n'akuku Edom, ókè-ala Ndida unu nwere gēsite kwa na nsọtu ahu nke Oké Osimiri Nnu nke chere iru n'Iru-anyanwu: 4 ókè-ala unu nwere gēsi kwa na Ndida b͕a buruburu rue nrigo Akrabim, ọ gāgabiga kwa rue Zin: ọpupu-ya nile gēsi kwa na Ndida Kedesh-banea; ọ gāpuru kwa Heza-ada, we gabiga rue Azmon: 5 ókè-ala ahu gēsi kwa n'Azmon b͕a buruburu rue miri-iyi Ijipt, ọpupu-ya nile gādiru kwa oké osimiri. 6 Ókè-ala ọdida-anyanwu kwa, unu gēnwe ọbuná oké osimiri uku ahu na ókè-ya: nka gāburu unu ókè-ala Ọdida-anyanwu 7 Nka gābu-kwa-ra unu ókè-ala Ugwu: unu gēsi n'oké osimiri uku ahu kpaputara onwe-unu ugwu Hoa: 8 unu gēsi n'ugwu Hoa kpaputarue nbata Hemat; ọpupu nile nke ókè-ala ahu gādiru kwa Zedad: 9 ókè-ala ahu gāputaru Zifron, ọpupu-ya nile gādiru kwa Heza-inan: nka gāburu unu ókè-ala Ugwu. 10 Unu gākpaputa-kwa-ra onwe-unu, ka ọ buru ókè-ala Iru-anyanwu, site na Heza-inan rue Shefam: 11 ókè-ala ahu gārida kwa site na Shefam rue Ribla, n'akuku Iru anyanwu Ain; ókè-ala ahu gārida kwa, we metu akuku oké osimiri Kineret nke chere iru n'Iru-anyanwu: 12 ókè-ala ahu gāridaru kwa Jọdan, ọpupu-ya nile gādiru kwa Oké Osimiri Nnu: nka gāburu unu ala, dika ókè-ala-ya nile si di buruburu. 13 Moses we nye umu Israel iwu, si, Nka bu ala ahu nke unu gēketa n'ife-nzà, nke Jehova nyere iwu bayere ya inye ebo iteghete ahu na nkera ebo ahu: 14 n'ihi na ebo umu ndi Reuben dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, na ebo umu ndi Gad dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, anarawo, nkera ebo Manase anarawo kwa, ihe-nketa-ha; 15 ebo abua ahu na nkera ebo ahu anarawo ihe-nketa-ha n'ofè Jọdan nka na nso Jeriko n'akuku Iru-anyanwu, n'uzọ ọwuwa-anyanwu. 16 Jehova we gwa Moses okwu, si, 17 Ndia bu aha ndikom ahu ndi gēme ka unu keta ala ahu: Eleeza, bú onye nchu-àjà, na Joshua nwa Nun. 18 Ọ bu kwa otù onye-isi otù onye-isi site n'ebo ọ bula ka unu gēkuru, ime ka eketa ala ahu. 19 Ndia bu aha ndikom ahu: nke ebo Juda, Keleb nwa Jefune. 20 Nke ebo umu Simeon, Shemuel nwa Amihud. 21 Nke ebo Benjamin, Elidad nwa Kislon. 22 Nke ebo umu Dan otù onye-isi kwa, bú Biku nwa Jọgli. 23 Nke umu Josef: nke ebo umu Manase otù onye-isi, bú Haniel nwa Ifod: 24 nke ebo umu Efraim otù onye-isi kwa, bú Kemuel nwa Shiftan. 25 Nke ebo umu Zebulun otù onye-isi kwa, bú Elizafan nwa Panak. 26 Nke ebo umu Isaka otù onye-isi kwa, bú Paltiel nwa Azan. 27 Nke ebo umu Asha otù onye-isi kwa, bú Ahihud nwa Shelomi. 28 Nke ebo umu Naftali otù onye-isi kwa, bú Padahel nwa Amihud. 29 Ndia bu ndi Jehova nyere iwu ime ka umu Israel Keta ala n'ala Kenean. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria