Ndị Ikpe 12 - Bible Nso1 Ndikom Efraim we kpọkọta onwe-ha, gabiga akuku Ugwu; ha we si Jefta, Gini mere i gabigara ibuso umu Amon agha, ma ayi ka i nākpọghi isoro gi je? ayi gēsure ulo-gi n'isi gi n'ọku. 2 Jefta we si ha, Onye nēse okwu nke-uku ka m'buworo, mu onwem na ndim na umu Amon; m'we tikue unu, ma unu azọputaghm n'aka-ha. 3 M'we hu na unu abughi ndi nāzọputam, m'we tiye ndum n'ọbu-akam, gabiga imegide umu Amon, Jehova we nye ha n'akam: n'ìhi gini kwa ka unu rigokuteworom ta ibusom agha? 4 Jefta we chikọta ndikom nile nke Gilead, buso Efraim agha: ndikom Gilead we tib͕ue Efraim, n'ihi na ha siri, Ndi b͕apuru ab͕apu nke Efraim ka unu, bú ndi Gilead, bu, n'etiti Efraim, na n'etiti Manase. 5 Gilead we were ngabiga-miri Jọdan nile n'uzo ije Efraim: o rue, mb͕e ndi b͕apuru ab͕apu nke Efraim siri, Ka m'gabiga, na ndikom Gilead siri ya, Ọ̀ bu onye Efraim ka i bu? Ọ si, É-è; 6 ha si ya, Biko, si Shibolet; ọ si, Sibolet; n'ihi na o dozighi onwe-ya ikpọ ya nke-ọma; ha we jide ya, b͕ue ya na ngabiga-miri Jọdan: orú nnù ndikom uzọ ise na nnù ise we da mb͕e ahu site n'Efraim. 7 Jefta we kpe Israel ikpe arọ isi. Jefta, bú onye Gilead, we nwua, elìe ya n'obodo Gilead. 8 Mb͕e ọ nwusiri, Ibzan, onye sitere na Bet-lehem, we kpe Israel ikpe. 9 O nwe-kwa-ra orú umu-ndikom na iri ọ muru, ọ bu kwa orú umu-ya ndinyom na iri ka o zipuru n'èzí, orú ndinyom na iri ka o me-kwa-ra ka ha si n'èzí batara umu-ya ndikom. O we kpe Israel ikpe arọ asa. 10 Ibzan we nwua, elìe ya na Bet-lehem. 11 Mb͕e ọ nwusiri, Ilon, bú onye Zebulun, we kpe Israel ikpe; o we kpe Israel arọ iri. 12 Ilon, bú onye Zebulun, we nwua, elìe ya n'Ajalon n'ala Zebulun. 13 Mb͕e ọ nwusiri, Abdon nwa Hilel, bú onye Piraton, we kpe Israel ikpe. 14 O nwe-kwa-ra ọgu umu-ndikom abua na orú umu umu na iri, ndi ọgu umu-inyinya-ibu atọ na iri nēbu: o we kpe Israel ikpe arọ asatọ. 15 Abdon nwa Hilel, bú onye Piraton, we nwua, elìe ya na Piraton n'ala Efraim, n'ugwu ndi Amalek. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria