Ndị Galeshịa 4 - Bible Nso1 Ma asim na ka oge ra onye-nketa ahu nọ ka nwa ọhu, ọ dighi iche n'ihe ọ bula n'ebe orù nọ, ọ bu ezie na ọ bu onye-nwe ihe nile; 2 kama ọ nọ n'okpuru ndi etiyere ya n'aka-ha na ndi nāchi èzí-na-ulo-ya rue oge nna-ya buru uzọ ka àka. 3 Otú a ayi onwe-ayi kwa, mb͕e ayi bu umu ọhu, ọ bu n'okpuru ihe-ozizí mbu nke uwa ka ejidere ayi dika orù 4 ma mb͕e oge ahu zuru, Chineke ziputara Ọkpara-Ya, Onye amuru site na nwanyi, Onye amuru n'okpuru iwu, 5 ka O we b͕aputa ndi nọ n'okpuru iwu, ka ayi we nata idi-ka-umu-ndikom ahu. 6 Ma n'ihi na unu bu umu-ndikom, Chineke ziputara Mọ nke Ọkpara-Ya ba nime obi-ayi, nēti nkpu, si, Aba, Nna. 7 Ya mere i bughi orù ọzọ, kama i bu nwa-nwoke; ma ọ buru na i bu nwa-nwoke, i bu kwa onye-nketa site n'aka Chineke. 8 Otú ọ di, mb͕e ahu, ebe unu nāmataghi Chineke, unu bu orù nke ndi nābughi chi dika ha si puta n'uwa: 9 ma ub͕u a, mb͕e unu maworo Chineke, ma-ọbu, nke bu ezi-okwu kari, unu bu ndi Chineke maworo, ùnu si aṅa chighari ọzọ n'ihe-ozizí mbu nādighi ike nēnweghi kwa ihe ọ bula, nke unu nācho ibu orù-ha ọzọ ọhu? 10 Unu nēlezi anya idebe ubọchi, na ọnwa, na oge, na arọ. 11 Anamatu egwu unu, ma o nwere uzọ ọ bula m'dọb͕uworo onwem n'ọlu n'aru unu n'efu. 12 Umu-nnam, ariọm unu, menu onwe-unu ka unu di ka mu onwem, n'ihi na mu onwem me-kwa-ra onwem ka m'di ka unu onwe-unu. Unu emeghm ajọ omume ọ bula: 13 ma unu matara na ọ bu n'ihi adighi-ike nke anu-aru ka m'zìri unu ozi ọma na mbu: 14 unu akpọghi kwa ihe di n'anu-arum nke bu ọnwunwa n'ebe unu nọ ihe-efu, ọ sọghi kwa unu oyi; kama unu naram nke-ọma dika mọ-ozi nke Chineke, dika Kraist Jisus. 15 Òle ebe ọ di kwa, bú ọkpukpọ unu nākpọ onwe-unu ndi ngọzi diri? n'ihi na ab͕aram unu àmà, na, ọ buru na ọ bu ihe unu puru ime, unu gāghuputawori anya-unu nyem. 16 Ya mere àghọwom onye-iro-unu, n'ihi na anamagwa unu ezi-okwu? 17 Ha were obi nānu ọku chọ unu n'uzọ nādighi nma; ma ha nāchọ imechibido unu uzọ n'èzí, ka unu we were obi nānu ọku chọ ha. 18 Ma ọ di nma ka ewere obi nānu ọku chọ unu n'ihe ọma mb͕e nile, ọ bughi kwa nání mb͕e m'nọ n'etiti unu. 19 Umu-ntakirim, unu ndi ime unu nēmem ọzọ rue mb͕e agēme ka udi Kraist di nime unu, 20 ọ gādim nọ̄ nma ma asi na apurum inọ n'etiti unu ub͕u a, na ib͕anwe olu m; n'ihi na enwerem obi abua n'ebe unu nọ. 21 Gwanum, unu ndi nāchọ inọ n'okpuru iwu, ùnu adighi-anu iwu ahu? 22 N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, na Abraham nwere umu-ndikom abua, otù site n'orù-nwanyi ahu, otù site kwa na nwanyi ahu nke nwere onwe-ya. 23 Ma ọ bu n'uzọ anu-aru ka amuworo nwa nke sitere n'orù-nwanyi ahu; ma esitewo na nkwa mu nwa nke sitere na nwanyi ahu nwere onwe-ya. 24 Ma ewere ihe ndia ma atù: n'ihi na ndinyom abua ndia bu ọb͕ub͕a-ndu abua; otù si n'ugwu Sainai puta, nāmu umu nye n'orù, nwanyi ahu bu Hega. 25 N'ihi na Sainai nka bu ugwu di n'Arebia, ya na Jerusalem nke di ub͕u a kwu kwa: n'ihi na ọ nọ n'orù, ya na umu-ya. 26 Ma Jerusalem nke di n'elu nwere onwe-ya, ya onwe-ya bu kwa nne ayi. 27 N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ka obi nātọ gi utọ, nwanyi-àgà nke nādighi-amu nwa; Tiwa nkpu ọṅù, ti kwa nkpu, gi onye ime nādighi-eme: N'ihi na umu nke nwanyi arapuru nání ya di ọtutu kari umu nke nwanyi ahu nwere di. 28 Ma ayi onwe-ayi, umu-nnam, bu umu nke nkwa, dika Aisak. 29 Ma dika onye amuru n'uzọ anu-aru sob͕uru onye amuru n'uzọ Mọ Nsọ mb͕e ahu, ọbuná otú a ka ọ di ub͕u a. 30 Otú ọ di, gini ka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nēkwu? Chupu orù-nwanyi a na nwa-ya nwoke: n'ihi na nwa-nwoke orù-nwanyi agagheso nwa nke nwanyi ahu nke nwere onwe ya keta ihe. 31 N'ihi nka, umu-nnam, ayi abughi umu nke orù-nwanyi, kama ayi bu umu nke nwanyi ahu nwere onwe-ya. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria