Levitikọs 11 - Bible Nso1 Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si ha, 2 Gwanu umu Israel okwu, si, Ndia bu anu di ndu unu gēri n'etiti anumanu nile nke di n'elu uwa. 3 Anu ọ bula nke ukwu-ya wara njakpa, nke ukwu-ya wara-kwa-ra awara, nke nātaghari kwa ọnu, n'etiti anumanu, nke ahu ka unu gēri. 4 Otú ọ di, ndia ka unu nāgaghi-eri n'etiti ihe nātaghari ọnu, ma-ọbu n'etiti ndi ukwu-ha wara njakpa: camel, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ọ bu, ma ọ bughi ihe ukwu-ya wara njakpa, ihe ruru árú ka ọ buru unu. 5 Coney kwa, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ọ bu, ma ukwu-ya awaghi njakpa, ihe ruru árú ka ọ buru unu. 6 Hare kwa, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ọ bu, ma ukwu-ya awaghi njakpa, ihe ruru árú ka ọ buru unu. 7 Ezì kwa, n'ihi na ihe ukwu-ya wara njakpa, nke ukwu-ya wara-kwa-ra awara, ka ọ bu, ma ya onwe-ya adighi-ataghari ọnu, ihe ruru árú ka ọ buru unu. 8 Unu erila ihe sitere n'anu-ha, unu emetu-kwa-la ozu-ha aka; ihe ruru árú ka ha buru unu. 9 Ndia ka unu gēri n'etiti ihe nile nke di na miri: ihe ọ bula nke nwere ntù na akpilikpa nime miri, n'oké osimiri nile, na n'osimiri nile, ha ka unu gēri. 10 Ma ihe ọ bula nke nēnweghi ntù na akpilikpa n'oké osimiri nile, na n'osimiri nile, site n'ihe nile nēnuputa na miri, site kwa n'anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke di nime miri, ihe-árú ka ha buru unu, 11 ihe-árú ka ha gābu-kwa-ra unu; unu erila ihe sitere n'anu-ha, unu gāgu kwa ozu-ha n'ihe-árú. 12 Ihe ọ bula nke nēnweghi ntù na akpilikpa nime miri, ihe-árú ka ọ buru unu. 13 Ndia ka unu gāgu kwa n'ihe-árú n'etiti anu-ufe; agaghi-eri ha, ihe-árú ka ha bu: ugo, na ego-agwọ, na ugo-azù; 14 na ndab͕u, na agu-nkwọ di iche iche; 15 ugolo-ọma ọ bula di iche iche; 16 na enyi-nnunu, na eb͕e-abali, na nnunu oké osimiri, na eb͕e di iche iche; 17 na okwukwu ntà, na cormorant, na okwukwu oku; 18 na okwukwu nwere mpi, na okwolo, na udele; 19 na ub͕ala, na utù di iche iche, na hoopoe, na usu. 20 Anu-ufe ọ bula nke nēnuputa enuputa, nke nēje ije n'ukwu anọ, ihe-árú ka ọ buru unu. 21 Ma otú ọ di, ndia ka unu gēri n'etiti anu-ufe nile nēnuputa enuputa, nke nēje ije n'ukwu anọ, nke nwere ogwe-ukwu n'elu ukwu-ala-ha, iji nākwu ntù n'elu ala; 22 ndia ka unu gēri n'etiti ha; igurube di iche iche, na akpa-nkwu di iche iche, na nbuzu di iche iche, na ogugu di iche iche. 23 Ma anu-ufe ọ bula nke nēnuputa enuputa, nke nwere ukwu anọ, ihe-árú ka ọ buru unu. 24 N'ihi ihe ndia ka unu gēme onwe-unu ndi ruru árú: onye ọ bula nke nēmetu ozu-ha aka gāru árú rue anyasi: 25 onye ọ bula nke nēbu ihe sitere n'ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi. 26 Anumanu ọ bula nke bu ihe ukwu-ya wara njakpa, ma ọ bughi ihe ukwu-ya warara awara, ọ bughi kwa ihe nātaghari ọnu, ihe ruru árú ka ha buru unu: onye ọ bula nke nēmetu ha aka gāru árú. 27 Ihe ọ bula kwa nke nēje ije n'ọbu-aka-ya, n'etiti anu nile di ndu nke nēje ije n'ukwu anọ, ihe ruru árú ka ha buru unu: onye ọ bula nke nēmetu ozu-ha aka gāru árú rue anyasi. 28 Onye nēbu ozu-ha gāsu uwe-ya, ọ gāru kwa árú rue anyasi: ihe ruru árú ka ha buru unu. 29 Ndia bu-kwa-ra unu ihe ruru árú n'etiti ihe nēnuputa enuputa, nke nēnuputa n'elu uwa: weasel, na oké, na agu-iyi di iche iche, 30 na ọba-miri, na ngwere-aghu, na ngwere, na ngwere-uzuzu, na owumagana. 31 Ndia buru unu ihe ruru árú n'etiti ihe nile nēnuputa enuputa: onye ọ bula nke nēmetu ha aka mb͕e ha nwuru anwu gāru árú rue anyasi. 32 Ihe ọ bula nke otù nime ha gādakwasi, mb͕e ha nwuru, ọ gāru kwa árú: ma ọ bu ihe osisi ọ bula, ma-ọbu uwe, ma-ọbu akpukpọ, ma-ọbu àkpà, ihe ọ bula nke eji ya eje ozi ọ bula, agētiye ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi; o we di ọcha. 33 Ihe ájá ọ bula nke otù nime ha gādabà nime ya, ihe ọ bula nke di nime ya gāru árú, ihe ájá ahu ka unu gētiwa kwa. 34 Nime ihe-oriri nile nke anēri, nke ahu nke miri di otú a gābiakwasi gāru árú: ihe-ọṅuṅu nile nke anāṅu nime ihe ọ bula di otú a gāru kwa árú. 35 Ihe ọ bula nke ihe si n'ozu-ha gādakwasi gāru kwa árú; ma ọ bu ite-ọku, ma-ọbu ekwu, agākwatu ya: ihe ruru árú ka ha bu, ihe ruru árú ka ba gābu-kwa-ra unu. 36 Ma otú ọ di, isi-iyi ma-ọbu olùlù-miri, bú nchikọta miri, gādi ọcha: ma onye nēmetu ozu-ha aka gāru árú. 37 Ma mb͕e ihe nke si n'ozu-ha gādakwasi nkpuru-ọghigha ọ bula nke anāgha agha, ihe di ọcha ka ọ bu. 38 Ma mb͕e agētiye miri n'elu nkpuru-ọghigha, ma ihe si n'ozu-ha adakwasi ya, ihe ruru árú ka ọ buru unu. 39 Ọzọ, mb͕e otù nime anumanu, nke buru unu ihe-oriri, gānwu; onye nēmetu ozu-ya aka gāru árú rue anyasi. 40 Onye nēri ufọdu nime ozu-ya gāsu uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi: onye ahu nke nēbu ozu-ya gāsu kwa uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi. 41 Ọzọ ihe ọ bula nke nēnuputa enuputa nke nēnuputa n'elu uwa, ihe-árú ka ọ bu; agaghi-eri ya. 42 Ihe ọ bula nke nēje ije n'afọ-ya, na ihe ọ bula nke nēje ije n'ukwu anọ, ma-ọbu ihe ọ bula nwere ọtutu ukwu, ọbuná ihe nile nēnuputa enuputa nke nēnuputa n'elu uwa, unu erila ha; n'ihi na ihe ruru árú ka ha bu. 43 Unu ejila ihe-nnuputa ọ bula nke nēnuputa enuputa me onwe-unu ka unu buru ihe-árú, unu eji-kwa-la ha meru onwe-unu, ewe were ha meru unu. 44 N'ihi na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu: unu gēdo kwa onwe-unu nsọ, we di nsọ; n'ihi na nsọ ka Mu onwem di: unu eji-kwa-la ihe-nnuputa ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa meru onwe-unu. 45 N'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka unu si n'ala Ijipt rigoputa, iburu unu Chineke: unu gādi kwa nsọ, n'ihi na nsọ ka Mu onwem di. 46 Nka bu iwu nke anumanu, na nke anu-ufe, na nke anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke nākpu akpu nime miri, na nke anu ọ bula nēnuputa enuputa n'elu uwa: 47 ka ewe kpa ókè n'etiti ihe ruru árú na ihe di ọcha, na n'etiti anu di ndu anēri eri na anu di ndu anādighi-eri eri. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria