Joshua 19 - Bible Nso1 Ife-nzà nke-abua we putara Simeon, bú ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di: ihe-nketa-ha di n'etiti ihe-nketa umu Juda. 2 Ha we nwe n'ihe-nketa-ha Bia-sheba, ma-ọbu Sheba, na Molada; 3 na Haza-shual, na Bala, na Ezem; 4 na Eltolad, na Betul, na Họma; 5 na Ziklag, na Bet-makabot, na Haza-susa; 6 na Bet-lebaot, na Sharuhen; obodo iri na atọ na obodo ntà ha: 7 na Ain, na Rimon, na Eta, na Ashan; obodo anọ na obodo ntà ha: 8 na obodo ntà nile nke di obodo ndia buruburu rue Bealat-bia, bú Rema nke Negeb. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Simeon dika ab͕uru nile ha si di. 9 Site n'òkè umu Juda ka ihe-nketa umu Simeon di: n'ihi na òkè umu Juda riri nne kari ha: umu Simeon we keta ihe n'etiti ihe-nketa-ha. 10 Ife-nzà nke-atọ we putara umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di: ókè-ala ihe-nketa-ha we di rue Sarid: 11 ókè-ala-ha we rigo n'akuku Ọdida-anyanwu, ru kwa Marala, we metu Dabeshet, metu kwa miri-iyi nke di n'iru Jọkneam; 12 o si na Sarid chigharia n'akuku Iru-anyanwu n'ọwuwa-anyanwu rue ókè-ala Kislot-teboa; ọ pua rue Daberat, we rigo rue Jafia; 13 o si n'ebe ahu gabiga n'akuku Iru-anyanwu n'akuku ọwuwa-anyanwu rue Gat-hefa, rue Et-kazin; ọ pua na Rimon, nke akpara rue Nea; 14 ókè-ala ahu we b͕a ya buruburu n'Ugwu rue Hanaton: ọpupu-ya di kwa na ndagwurugwu Ifta-el; 15 na Katat, na Nahalal, na Shimron, na Idala, na Bet-lehem: obodo iri na abua na obodo ntà ha. 16 Nka bu ihe-nketa umu Zebulun dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha. 17 Ife-nzà nke-anọ we putara Isaka, bú umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di. 18 Ókè-ala-ha we rue Jezreel, na Kesulot, na Shunem; 19 na Hafaraim, na Shion, na Anaharat; 20 na Rabit, na Kishion, na Ebez; 21 na Remet, na En-ganim, na En-hada, na Bet-pazez: 22 ókè-ala ahu we metu Teboa, na Shahazuma, na Bet-shemesh; ọpupu ókè-ala-ha di kwa na Jọdan: obodo iri na isi na obodo ntà ha. 23 Nka bu ihe-nketa ebo umu Isaka dika ab͕uru nile ha si di, obodo ahu na obodo ntà ha. 24 Ife-nzà nke-ise we putara ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di. 25 Ókè-ala-ha we buru Helkat, na Hali, na Beten, na Akshaf; 26 na Alamelek, na Amad, na Mishal; ọ metu Kamel n'akuku Ọdida-anyanwu, metu kwa Shaihoa-libnat; 27 ọ we chigharia n'ọwuwa-anyanwu rue Bet-degon, we metu Zebulun, metu kwa ndagwurugwu Ifta-el n'akuku Ugwu rue Bet-emek na Neiel; ọ pua rue Kabul n'aka-ekpe, 28 na Ebron, na Rehob, na Hamon, na Kena, we rue Zaidon bara uba; 29 ókè-ala ahu we chigharia rue Rema, ru kwa obodo ahu ewusiri ike, bú Taia; ókè-ala ahu we chigharia rue Hosa; ọpupu-ya di kwa n'oké osimiri site na Hebel rue Akzib: 30 na Uma, na Efek, na Rehob: orú obodo na abua na obodo ntà ha. 31 Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha. 32 Ọ bu umu Naftali ka ife-nzà nke-isi putara, bú umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di. 33 Ókè-ala-ha we site na Helef, site n'osisi terebinth nime Zaananim, na Adami-nekeb, na Jabneel, rue Lakum; ọpupu-ya we di na Jọdan: 34 ókè-ala ahu we chigharia n'akuku Ọdida-anyanwu rue Aznot-teboa, si n'ebe ahu pua rue Hukok; ọ metu Zebulun na Ndida, metu kwa Asha n'Ọdida-anyanwu, metu kwa Juda n'akuku Jọdan n'ọwuwa-anyanwu. 35 Obodo ewusiri ike bu Zidim, na Zea, na Hamat, na Rakat, na Kineret; 36 na Adama, na Rema, na Hezoa; 37 na Kedesh, na Edrei, na En-hezoa; 38 na Iron, na Migdal-el, na Horem, na Bet-anat, na Bet-shemesh; obodo iri na iteghete na obodo ntà ha. 39 Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà ha. 40 Ọ bu ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di ka ife-nzà nke-asa putara. 41 Ókè-ala ihe-nketa-ha we buru Zọra, na Eshtaol, na Ia-shemesh; 42 na Shaalabin na Ajalon, na Itla; 43 na Ilon, na Timna, na Ekron; 44 na Elteke, na Gibeton, na Bealat; 45 na Jihud, na Bene-berak, na Gat-rimon; 46 na Me-jakon, na Rakon, tiyere ókè-ala di na ncherita-iru Jafo. 47 Ókè-ala umu Dan we si n'ebe ha nọ pua: umu Dan we rigo, buso Leshem agha, were ya, were ọnu mma-agha tib͕ue ya, ha we nweta ya, biri nime ya, we kpọ Leshem, Dan, dika aha Dan, bú nna-ha, si di. 48 Nka bu ihe-nketa ebo umu Dan dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha. 49 Ha we mesia ka eketa ala ahu dika ókè-ala-ya nile si di; umu Israel we nye Joshua nwa Nun ihe-nketa n'etiti ha: 50 n'okwu-ọnu Jehova ka ha nyere ya obodo ahu nke ọ riọrọ, bú Timnat-sera n'ugwu Efraim: o wue obodo ahu, biri nime ya. 51 Ndia bu ihe-nketa, nke Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo ndi bu nna ebo umu Israel, mere ka eketa n'ife-nzà nime Shailo n'iru Jehova, n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute. Ha we kebìe ala ahu. |
Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006.
Bible Society of Nigeria